You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọgbọ gaasị gbawara ka ogbunigwe egbuola ndị mmadụ na Kaduna
Akụkọ si obodo Kaduna na-akọwa na ọgbọ gaasi gbara na-ebe a na-ere gassi n'ehihe Satọde nwereike bụrụ na-ọtara isi mmadụ
Ndị uweojii egbochiela ebe ihe a mere dịka anya hụru na-ekwu na amabeghị mmadu ole ometụtara.
Ndị mmadụ tinyere ihe nkiri gosiri ka o mechara.
Gọọmentị Kaduna tinyere ọnụ n'ihe mere ma tie ndị ometụtara aka n'obi.
Gwongworo egbuola mmadụ na Legọs
Mmadụ abụọ nwụrụ ebe otu onye merụrụ ezigbote ahụ dịka gwongworo bu okwute na obere ụgbọala Lexus kwakọrọ isi n'akwa Otedola dị na Legọs, nke butere ọnwụ mmadu abụọ ma mmerụ mmadụ atọ ọzọ ahụ.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọrụ gbatagbata bụ Oluwafemi Oke-Osanyintole sị na amabeghị aha ndị o metụtara.
Ọ sị na otu onye n'ime ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ ebe mmadụ abụọ merụrụ obere ahụ nke mere na akpọgaghị ha ụlọọgwụ.
Ọ sị; "Gwongworo ahụ mịchapụrụ n'elu akwa mmiri ahụ wee mabanye n'ụzọ nke obere ụgbọala ahụ."
Ndị agha Chad alaala n'ọgụ Boko Haram
Mba Chad Akpọpụla ndị agha ha so ndị nke Naịjirịa ebuso ndi oyi ndụ egwu Boko Haram na ISIS ọgụ na mpaghara ugwu Naijirịa.
Ọchịagha Azem Bermandoa bu ọnu na-ekwuru ndị agha Chad gwara ndị ntaakukọ AFP na ndi agha ha arụchala ọru ha gara.
Nke a n'abịa ka gọọmentị Naijirịa kwuru na a ga-akpọpụ ndị agha n'ụfọdụ ebe ha nọbụ ebuso ndi omekome a agha.
N'ofesi,
Mba Amerịka ezigala ndị agha puku atọ na narị ise mpaghara Bekee kpọrọ Middle East dịka mgbarụ ihu ha na mba Iran maka ogbugbu Qassim Suleimani na akpata okwu agha n'etiti mba abụọ a.
Amalitela agba nke atọ n'Iko FA nke Ịngland
Na nke agbara agba Millwall ji ọkpụ goolu atọ nyụo Newport ikpakwụ dịka Newcastle na Roachdale ji otu ọkpụ gba nhatanha.