East security: Kutuo ọgba na nkọrọ dị n'ọhịa Agwu - Gọvanọ Ugwuanyi

Dịka okwu nchekwa na-aga n'ihu aka na-achị Enugwu steeti bụ Govanọ Ifeanyi Ugwuanyi enyela iwu ka a kutuo ma sụchapụ ọhia dị n'Agwụ.

O kwuru nke a mgbe ọ gara inyocha ọwa ebe ndị ntọrị na-ezo ma na-esi eri mpọmpọ ọsọ nke dị n'okporoụzọ Enugwu-Pọt Hakụt nke ụmụogbua dị n'okpụrụọchichị Agwụ.

Gọvanọ Ugwuanyi gakwara n'ime ohia Ihe-Agbogugu-Ogbaku-Amuri na Isu-Awaa-Agbudu ebe o nyere iwu ka akwatucha ọgba niile dị n'ohia a.

Ugwuanyi ga kwara nyocha n'ebe a na aru ogige obibi ndị agha ndke dịkwa n'okporo ụzọ Enugwu-Pọt Hakụt, na ụmụogbua dị n'okpụrụ ọchichị Ọgwụ

Ndị so mee njem a bụ onyeisioche okpuruọchịchị Agwu bụ Stanley Okeke na ndị na-anọchite anya mpaghara "North and South" nke Agwu bụ Jane Eneh na Johnson Chukwuobasi.

Ugwu anyị kwuru na ndi uweojii na ndịagha ga-amalite ọrụ nchekwa na mpaghara a iji kwalite nchekwa ndị mmadụ.

Cheta na ọ bụ n'Enugwu Steeti ka ndị ntọri tọrọ Igwe Sunday Orji bụ Eze ndị Obom Agbogugu dị n'okpuruọchịchị Awgu ma mechaa tọhapụ ya.

Enugwu steeti ga kwara n'ihu hiwe ngalaba nchekwa ọhia a kporo "Forest Rangers" n'olu Bekee maka nchekwa ndị ime ọbodo.

Lee Akụkọ Ga-Amasị gị

Lee Ihe Nkịri a