You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu Security: Kedụ ndị bụ 'Forest Rangers' a Enugu Steeti na-achọ ihiwe?
Nchekwa ndụ na akụnaụba obodo bụ oke na ọrụ dịrị gọọmentị etiti nakwa nke steeti ọbụla.
A bịa na Naịjirịa e nwere ngalaba nchekwa dị icheiche gụnyere Ndịagha, ndị uweojii na ndị nchekwa ọdịnala dgz.
Gọọmentị Enugwu Steeti ehiwere ngalaba nchekwa a kpọrọ 'Forest Rangers' iji chekwaa steeti ha site n'aka ndị mpụ na omekome.
Kedụ ndị bụ 'Forest Rangers'?
Otu onye ọkachamara n'okwu nchekwa ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ nchekwa 'Spider Security' bụ Uzoma Anyakora kwuru na 'Forest guards' bụ;
- Ndị oru nchekwa ime obodo dị na Steeti nakwa okpuru ọchịchị obodo dị icheiche.
- Ha bụ ụmụafọ obodo ha na-echekwa ma maarakwa ndị bụ ndị obodo, mpio na nnọ nke obodo ahụ.
- Ụfọdụ n'ime ha na-abụ ndị dinta maara etu e si awa ime oke ọhịa nke ọma.
Gịnị bụ ọrụ ndị 'Forest Rangers'?
Uzoma Anyakora kwuru na ọrụ ndị a gụnyere;
- Ichekwa oke ọhịa niile gbara obodo ha gburugburu, chekwara mkpụrụosisi na akụrụngwa ndị ọrụugbo.
- Ha na-enyopụta mgbe ndị mbịarambịara ọbụla batara n'ime obodo.
- Ha na-egbochi ndị mpụ na ndị omekome ịbata n'obodo.
- Ha na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ site n'ịgbara ha ama banyere ndị ọjọọ nọ n'obodo.
Anyakora gara n'ihu kwuo na ihiwe ụdị nchekwa ga-enye aka ibelata oke mpụ, ohi na ntọrị mmadụ dị ugbua.
Cheta na ogbugbu na ntọrị ndị mmadụ na-arị ibe ya elu na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa gụnyere n'Enugwu Steeti.