Enugu Kidnapping: A tọhapụla Eze ndị Agbogugu na nwunye ya

Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị ugbua na-ekwu na a tọhapụla Igwe Sunday Orji bụ Eze ndị Obom Agbogugu dị n'okpuruọchịchị Awgu, Enugwu Steeti.

Cheta na ndị ekperima tọọrọ Eze ahụ na nwunye ya mgbe ha si ebe ha gara mmemme alọta na Sọnde, abalị anọ nke ọnwa Ọgọst.

Mazị Nwafor Chiedozie, onye e ji CNN mara, ziteere BBC Igbo ozi a n'uhuruchi taa bụ Wenezdee.

O dere sị: "Igwe na nwunye ya e nwerela onwe ha".

Chiedozie bụ onye jibu ọkwa "Councilor" n'Agbogugu ma bụrụkwa onye so zọọ ndọrọndọrọ maka onyeisioche okpuruọchịchị Awgu n'afọ 2017.

Ọ kọwaghị etu e si gbapụta Eze ahụ na nwunye ya.

Mana Ebere Amarizu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti, gwara BBC Igbo na Igwe Orji na nwunye enwerela onwe ha n'ezie.

Mgbe anyị jụrụ ya ma a kwụrụ ndị ntọ ahụ ụgwọ tupu ha a tọhapụ ha, o kwuru na ndị uweojii anaghị akwụ onye maọbụ ndị ọbụla ụgwọ.

N'okwu ya, "anyị na-agbazị mbọ ugbua ịnwụchị ndị ekperima kpara arụ a."

Chetakwa na ọ bụ n'okirikiri ebe a nọ tọrọ Eze ahụ ka ndị omekome nọ gbagbuo otu ụkọchukwu ụka Katọlik aha ya bụ Paul Offu n'izuuka gara aga.

Dịka Chiedozie siri kwuo mgbe ihe ka mechara, ndị uweojii gbalịrị nke ọma ịchọta Eze ọdinala ahụ.

O kwuru na ụgbọla ndị uweojii anọ na-akpagharị n'okirikiri obodo ha oge ahụ.

O kwukwara na ọ hụrụ otu ụgbọelu ndị uweojii ka ọ na-erughari.

"Nke a pụtara na ndị uweojii na-agba mbọ i ji hụ na eze anyị pụtara."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: