Coronavirus: Akụkọ ụgha gbasara nje a i kwesiri ịgbachi nkịtị

Coronavirus na-efesa mba ụwa niile mana o nwebeghi ọgwụgwọ ewepụtara maka ya.

N'agbanyeghị nke a, ndị aghụghọ amalitela ịwepụta akụkọ ndị abụghị eziokwu gbasara ọgwụgwọ ya.

Anyị elebaala anya n'ụfọdụ ụdịrị akụkọ ụgha a nakwa nke bụ eziokwu na ya.

1. Garlic

Ụfọdụ mmadụ ekwuola na ị ri Garlic ga-enye aka n'igbochi ọrịa a.

Mana ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa niile bụ "World Health Organisation" (WHO) n'aha ịchafụ ekwuola na o nweghi ihe akaebe gosiri na Garlic na-agwọ ọrịa ahụ.

Otu ụlọ ntaakụkọ na Chaịna biputere akụkọ otu nwaanyị gara ụlọọgwụ maka akpịrị ya n'ihi na o riri ihe ruru otu kg Garlic.

2. Mkpomọkụ na-egbu nje bụ ọrịa ahụ.

O nwere akụkọ dị iche iche na-efegharị maka etu mkpomọkụ na ihe ndị dị ọkụ si egbu ọrịa ahụ.

Otu n'ime ha ekesara n'ọtụtụ mba na-ekwu na ịṅụ mmiri ọkụ nakwa ịnọ n'ime anwụ na-egbu ọrịa ahụ

Ha kwukwara na okwu ụgha ahụ si n'aka Unicef na-ahụ maka ọdịnma ụmụaka nke ha pụtara gọọ.

Ọkammụta Bloomfield kwuru na ọ bụrụ na ịbu nje ahụ, ọ dịrị ahụ gị ịji aka ya wepu ya.

"Ọ dị mma iji mmiri ọkụ asụ akwa gị mana ọ dịghị mma ịji ya saa ahụ gị" ka o kwukwara.

3. Ndị agbụrụ ojii anaghị ebute ọrịa Coronavirus

Akụkọ ụgha ọzọ na-efegharị na-akọwa na ndị agbụrụ ojii, ọ kachasị n'Afrịka anaghị ebute ọrịa ahụ.

Mana kemgbe akụkọ ahụ pụtara, ụfọdụ ndị ojii a ma ama ebutela ọrịa ahụ.

Ha gụnyere Idris Elba na-eme ihe onyonyo, Blaise Matuidi nakwa King Paul Akpan Udoh bụ ndị ọgba bọọlụ.

4. Ịnụ mmiri kwa nkeji iri na ise

O nwere akụkọ ekesara na Facebook kwuru na "otu dọkịta Japan" kwuru na ịṅụ mmiri kwa nke iri na ise ga-asachapụ nje ọrịa ahụ bara ọṅụ.

Ọkammụta Trudie Lang kwuru na o nweghi ọrị ahụ ọbụla gosiri na ị ga-ejinwu mmiri sachapụ nje n'ime ahụ gị.

Nje ndị yiri Coronavirus na-abanye n'akụkụ ebe mmadụ si ekuru ume nke mere na mmiri agaghị asapụ ya.

N'agbanyeghị nke a, o kwuru na mmiri ọṅụṅụ na-adị mma n'ahụ.

5. 'Sanitizer' arụpụtara n'ụlọ

Kemgbe ọrịa Coronavirus malitere, ọṅụ ihe ịkwọ aka bụ "Hand Sanitizer" arịala elu nke ukwu.

Nke a mere na ọtụtụ ndị mmadụ bidoro ịdepụta ụzọ ị ga-esi mepụta "Hand Sanitizer" nke gị na be gị.

Mana ndị ọrụ sayensị kwuru na ihe ndị a adịghị mma n'elu ahụ n'ihi na Sanitizer na-enwe ihe dị n'ime ya ga-eme ka ọ ghara ịmerụ mmadụ ahụ.

Ọkammụta Bloomfield kwukwara na o kwenyeghị na ndị mmadụ nwereike ị rụpụta Santizer ga-edebe aka mmadụ ọcha n'ụlọ ha.

Ihe onyonyo ga-amasị gị