Coronavirus: Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus

Ọrịa Coronavirus bụ ọrịa na-efe efe si n'ikuru ume na-egbu mmadụ. A chọpụtara ya n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna.

Gịnị bụ coronavirus?

Ọrịa coronavirus na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ.

A chọpụtara nke a ka ndị ahụike na-elekọta ndị bu ya butekwara ya.

Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ na-akpa arụ.

Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Sars (si na buusu malite) nakwa Mers (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite.

Olee mba ndị coronavirus metụtara?

Kedụ ihe eji amata Coronavirus

Ọ na-ebidokarị dịka ahụọkụ na ọkwara ike.

O ruo otu izuụka, ọ bido ume obibi (onye ahụ agaghịzị eku ume nke ọma), mgbe ahụ onye ahụ nwere ike ịnọ n'ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.

Ọ na-egosịkwa dịka ahụụfụ na ike ọgwụgwụ.

Mana onwere ike ịnọrụ izuụka abụọ n'ahụ mmadụ tupu ihe ndị a egosiwa.

O nwere mgbochi?

Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya.

  • Kpuchie imi na ọnụ mgbe ị na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere.
  • Gbado anya, mara etu gị na onye na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere si emekọrịta
  • Jiri mmiri na ncha na-akwọ aka gị kwa mgbe kwa mgbe.
  • Gbaa mbọ hụ na e siri akwa na anụ ị na-eri ọfụma tupu i rie ya.

Kedụ ebe a kwụ akwụ ugbua?

A ka na-enyocha ihe si n'ahụ ndị na-arịa ọrịa a na laabụ, ịchọpụta ihe kpatara ya na etu e si agwọ ya.

Ihe nkiri a maka nwaanyị meriri ọrịa kansa ga-amasị gị: