Lyme Disease: Ihe ị kwesiri ịma maka ọrịa a chịnchị na-ebute

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

'Lyme disease' bụ ọrịa nke chịnchị ( 'tick arthropod') na-ebute nke nwere ike imetụ ụbụrụ maọbụ bute ịkpịkpa na ahụ mgbu.

Ọrịa 'Lyme' bidoro iwu na soshal midia dịka otiegwu Justin Bueber gbara ama na ya bụ ọrịa ji ya.

Ọ na-efe mmadụ ma ọ bụrụ na chịnchị bu ọrịa taa gị ma tanye gị nje bu ọrịa ahụ n'ahụ.

ị ṅụ ọbara na-amasị chịnchị ya mere ọ na-anọkarị n'ahịhịa n'ọhịa na-eche anụ ọ ga amado ma mịa ọbara.

Ọ na-anọkwa anụ ụlọ nwere anumanụ dịka nkịta, ewu, atụrụ maọbụ nwamba.

Chịnchị nwekwara ike izo n'akwa,oche nakwa ụlọ adịghị ọcha.

Ọrịa 'Lyme' na-akpa ike na mba Amerịka ugbua, ebe e nwere ya mbụ na mba Briten n'afọ 2019.

Mana dịka Dọkịta Bayo Onajole siri kọwaa, e nwere ike ịhụ ya bụ ọrịa n'ime obodo na Naijiria.

Onajole, onye bụ ọkammmụta ahụike ọha na mahadum 'Lagos University Teaching Hospital(LUTH) kọwara n'ọrịa na-adịkarị "n'ime obodo ebe ndị mmadụ na-ewu ụlọ ata n'ihi na ọ bụ ụdị ebea ka ahụhụ na-ebu nje ọrịa na-amụba."

Njirimara ọrịa 'lyme disease'

Dịka ngalaba na-ahụmaka mgbochi ọrịa na mba Amerịka bụ CDC siri kọwapụta na websaitị ha, ihe ndị e ji ama onye ọrịa 'lyme' ji gụnyere;

  • Ahụọkụ
  • Ike ọgwụgwụ
  • Ịkpịkpa- Ịkpịkpa nwere ike bido site ebe chinchi tara ma gbasaa n'akụkụ ndị ọzọ.
  • Mkpọnwụ ihu
  • Oyi ọmụma
  • Ihe mgbu n'akwara, ọkpụkpụ, aka maọbụ n'ụkwụ

Ọgwụgwụ ọrịa 'Lyme'

Dọkịta Ọnajole kwuru na a na-eji ọgwụ 'antibiotics' ekpochapụ ọrịa 'lyme' n'ahụ onye ọ na-eme.

Ihe i nwere ike ime iji gbochie ibute ya

  • Onajole kọwakwara na-ụzọ e si egbochi ọrịa ahụ bụ ihụ na chịnchị001785
  • anaghị amụba na gburugburu site n'idobe ebe niile ọcha.
  • Yichie ọnwe gị ma ị na-aga n'ọhịa maọbụ ebe chịnchị nọ
  • Ọ taa gị, nwere mmiri na ncha saachapụ ebe ọ tara gị
  • Gaa hụ dọkịta gị ma ịhụta njirimara ọrịa lyme n'ahụ gị maọbụ n'ahụ onye nọ gị nso

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: