Coronavirus aghọọla ọrịa 'o zuru-ụwa-ọnụ' - WHO

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Otu ahụike mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ akpọpụtala Coronavirus dịka ọrịa 'o zuru ụwa ọnụ' nke Bekee kpọrọ "pandemic" dịka ọrịa ahụ metụrala mmadụ 118,000 na mba 114 countries, ebe mmadụ 4,291 tụnyerela ndụ ha.

Onyeisi WHO bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onye kwupụtara nke a na mgbede Wenezde ka ọ na-agwa ndị ntakụkọ okwu,kwuru na nnu aghala ya bụ ofe dịka ọrịa ahụ.

" WHO na-elebanye anya n'ọrịa kemgbe ọ gbakapụtara ma ihe kachasị echu anyị ụra bụ ka o si efesasị na-akpa ike nakwa ka ọtụtụ siri gba nkiti ghara ime ihe ọbụla."

"Puku kwuru puku nọ n'ụlọgwụ na-alụ ọgụ ọnwụ na ndụ. "Thousands more are fighting for their lives in hospitals.

N'abali ole na izuụka ole na-abịa, anyị na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị nwere #COVID19, nakwa ndị ga-anwụ site n'ọrịa nakwa mba ndị ọ ga-emetụta ga-agbali karịa."

Dr Tedros gara n'ihu kwuo na n'izuụka abụọ gara aga, ndị burula ọrịa ma agụpụ Chaina dị mmaji iri na atọ, ebe mba dị oferela dị mmaji atọ.

"Ugbua enweela mmadụ 118,000 na mba 114 countries, ebe mmadụ 4,291 tụnyerela ndụ. "

O kwuru na ụfọdụ mba enweghị ndị ọrụ doro anya , ụfọdụ obodo enweghị ihe ọ ga-eri, ebe mba ụfọdụ enweghị mkpebi obi ime ihe kwesịrị."

Ihe mere na Mgbo, Ebonyi steeti

Nwa eze obodo Ngbo dị na Ebonyi steeti bụ Uche Ali ekwuola ọgbaghara tara isi ọtụtụ mmadụ n'obodo ha ụbọchi Tuzde bụ okwu ala dị n'etiti ha na ndị Agila dị na Benue steeti, na ọ bụghị nso ndị ọchịehi.

Igweokụ latrik na iwu ụlọomeiwu

Ị nụla na ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itinye anya n' iwu ga-amachi ịtụbata maọbụ ire igweọkụ latrik.

Sanusi na El-Rufai

Nke a bụ ọrụ nke abụọ Gọvanọ Nasir El-Rufai na-enye Sanusi na abalị nabọ a chuturu ya n'oche eze.

Atụọla Harvey Weinstein nga

Ụlọikpe mba Amerika atụọla nwoke amama amam na Hollywood bụ Harvey Weinstein nga afọ iri abụọ na atọ maka ịwakpo ụmụnwaanyị.

E bughariri asompị Arsenal maka ụfọdụ ndị otu ahụ zutere onye bu Coronavirus

Ebugharịala asọmpị dị n'etiti otu Arsenal nakwa Manchester City n'ihi ọrịa Coronavirus.

Ozi otu Arsenal dere na peeji ha sị na ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ ha na Evangelis Marianakis nwe otu Olympiakos enweela mmekọ mbụ.

Cheta na nje a abụghi akuko ifo. Gbado anya ma ga BBC Igbo dọt kọm gụọ akụkọ anyi nwere gbara ya.

Ụlọikpe eyigharịala ikpe Sowore ọzọ

Ụlọikpe ukwu na Abuja eyighrịala ikpe Omoyele Sowere onye kpokọbara "#Revolutionnow" ọzọ.

Ha bụgara ya ụbọchị 1 na 2 ọnwa Eprelụ iji nye ohere ka ndị gbara ya akwụkwọ wekọta ihe ndị akaebe ha chọrọ iji kpe ikpe.

Ijeoma Ojukwu bụ onye ọkwaiwu kachasị na ya bụ ikpe gbarụrụ ihu maka etu ndị gbara akwụkwọ esighị dị njikere n'ikpe a.

Cheta na gọọmentị Naịjirịa boro Omoyele Sowore ebubo ịgba mgba okpuru nke mere ha ji jichie ya ọnwa ole na ole n'afọ gara aga.

Ọ bụ Buhari nyere iwu ka achụtuo Sanusi Lamido - Kwankwaso

Aka chịbụrụ Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso etinyela ọnụ n'okwu na-akpọtụ maka Sanusi Lamido Sanusi.

Kwankwaso kwuru na ọ bụ onyeisiala Buhari nyere iwu ka a chutuo ya n'ọkwa sị na "ndị isi n'ebe ahụ n'onwe ha kwuru na e si n'elu nye ha iwu."

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Monde ka Gọvanọ Umar Ganduje nke Kano steeti chụturu Emir Sanuisi Lamido Sanusi n'ọkwa ma dochie onye ọzọ.

Rue ugbua, anụbeghị 'pịm' n'ọnụ Onyeisiala Buhari maọbụ gọọmentị ya n'ihe na kpọtụ na Kano steeti.

Minista na-ahụ maka ahuike ndị mba Briten bụ Nadine Dorries ebutela ọrịa coronavirus.

Dorries onye dị afọ iri isiina abụọ kwuru na ọ wepụrụ onwe ya iche n'ụlọ ya mgbe ọ chọpụtara na o bu ya bụ ọria Coronavirus.

Mịnịsta Dories bụ onye mbụ bụ onye omeiwu Briten bu ọrịa Coronavirus.

Ndị bu ọrịa a na mba Briten eruola mmadu narị atọ iri asatọ na abụọ ebe mmadụ isii lagoro mụọ maka ya bụ ọrịa na Briten.

Dịka ọ dị ugbua, Dorries kwuru na akwụkwọ ọ depụtara na ngalaba na-ahụ maka ahuike ebidola ịchọpụta ndị niile ha na ya nwere mmekọ.

O kwu kwara na twitter ya were sị "Ọ bụchaghị ihe nwere isi, ebum n'obi na nke ka njọ agafela...kama ọ bụ nne m gbara afọ iri asatọ na anọ mụ na ya bị bidoro kwọwa ụkwara ka ụche m dị."

"Ọdọụgbọelu Enugwu agafena Eprelu" - Ndị ụlọomeiwu

Ndị ụlọomeiwu ukwu na nta nke Naịjirịa agbarụọla ihu gbasara ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam nke dị n'Enugwu.

Ha gwara ndị ji ọrụ ngo ahụ ha gbaa mbọ rụtọpụ ya n'ọnwa Eprelu dịka ha si kwe nkwa maọbụ anapụ ha ya bụ ọrụ n'aka.

Onyeisi otu ndị omeiwu na-elekọta njem ụgbọelu bụ Nnolim Nnaji kwuru nke a dịka ha gachara njem nleta n'ụdọụgbọelu ahụ.

Sanusi Lamido eritela ọkwa ọzọ

Gọvanọ na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai etinyela Sanusi Lamido Sanusi bụ bụ eze Kano n'ọkwa na ngalaba na-ahụ maka mwulite akụnaụba steeti ahụ.

Nke a na-abịa dịka Sanusi Lamido na-akwado ị ga ụlọikpe ịgbagha nchutu achuturu ya n'oche.

Ronaldinho atọla na mkpọrọ

Otu ọkaiwu na mba Paraguay ajụla ịnye ikike ka atọghapụ ọgba bọolụ a ma ama bụ Ronaldinho n'ụlọ mkpọrọ.

Cheta na anwụchịrị ya na nwanne ya nwoke n'ụbọchị Fraide izuụka gara aga maka iji akwụkwọ njem adịgboroja bata mba ahụ.

Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a