You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Coronavirus: Idris Elba ebutela coronavirus
Onye na-eme ihe nkiri a ma ama bụ Idris Elba ebutela coronavirus dịka o si kwuo n'akara soshal midia ya.
Elba sị na e nyochara ya n'ụtụtụ taa ma chọpụta na o bu ọrịa coronavirus. O kwuru na ya na onye bu ọrịa a nwere mmekọ ahụ n'ụbọchị Fraịde.
Ọ sị na onwebeghi etu ahụ si eme ya ugbua mana ọ gbachiela onwe ya n'ụlọ maka nke a.
Ọ rịọkwara ka ndị mmadụ na-asa aka oge ọbụla ma dosa ebe ha bi ọcha mgbe niile.
Mba Briten amachiela ime njem, ọgbakọ maka coronavirus
Boris Johnson, onyeisiala mba Briten agbarụọla ihu kwuo ka ndị mmadụ bi na UK kwụsị ịme njem na-adịghị oke mkpa bụ nke ga-ebenata mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ha maka mgbasa Coronavirus dịka ọnụọgụ ndị nwụgoro na ya bụ ọrịa rugoro iri ise na atọ.
Johnso kwuru ka onye ọbụla nwere ike sị na ụlọ ha na-arụ ọrụ dịka otu n'ime usoro ọhụrụ gọọmenti wepụtara iji buso ọrịa a agha.
O kwuru ka ndị rugoro afọ iri asaa nakwa ndị ahụ esichaghị ike nwere okwuo kpọrọ ihe.
Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja akwụsịla nchutu Adams Oshiomole dịka onyeisioche pati All Progressive Congress.
N'ikpe ndị ọkaikpe atọ nke ọkaipke Abubakar Yahaya nọ n'isi ya chabiri n'ụbọchị Mọnde, kwuru ka nchutu Oshiomole nke ụlọikpe ukwu nyere iwu ya kwụsị.
Ụlọikpe a sị na iwu a ga-adị ruo ụbọchị Fraịde mgbe a ga-eleba anya n'akwụkwọ Oshiomole gbara.
Cheta na ụlọikpe dị n'Abuja nyere iwu n'ụbọchị 4 Maachị ka Oshiomole kwụsị igosi onwe ya ka onyeisi APC.
Nlele nke mbụ ọgwụ mgbochi coronavirus ga-amakite ụbọchị Monde na mba Amerika, dịka anyị nụru.
Mmadụ iri anọ na ise ahụ dị mma ekwetala ịnara ya bụ ọgwụ n'ụlọ ọchacha dị na Kaiser Permanente, Seattle.
Ya bụ ọgwụ nwere oyiri ya bụ nje dị na ya mana ya bụ nje ezughị ibute ya bụ ọrịa n'ahụ mmadụ.
Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ ka ga-ete aka tupu amara ka ya bụ ọgwụ maọbụ ọgwụ ndị ọzọ na-emepụta ọ ga-arụ ọrụ.
Ndị ọrụ Sayensi n'ụwa gbaa gburu na-agba mbọ ịmata ka ha aga emepụta ọgwụ mgbochi ọrịa a ngwangwa.
Ndị weputere ego maka nnwale ọgwụ a nke mbụ n'ahụ mmadụ bụ ndị National Institutes of Health sị na ha mafere usoro nke mbụ e si anwale ọgwụ mgbochi bụ nke na-enye aka ịmata ka ya bụ ọgwụ ọ ga-adịkwa ire n'ahụ mmadụ.
Mana ụlọọrụ na-ahụ maka ya bụ nchọcha bụ Moderna Therapeutics sị na usoro eji mepụta ya bụ ọgwụ bụ usoro e ji emepụta ọgwụ mgbochi kemgbe ụwa.
Na Lọs Angelis dị na New Yọk dị Amerịka, ọ bụ emechiela ebe a na-ere nri na mmanya.
Ghana, Kenya, Saụt Afịrịka nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ amachiela ndị si mba nje fesara ọfụma ịbata.
Saụt Afrịka na Sierra Leone emechiela ụlọakwụkwọ.
Moroko amachiela ụgbọelu si mba ofesi ịbata mba ahụ.
Nke mere ka ụfọdụ na-aju ihe ji Naịjirịa.
Onye nọ na "Parklane' Enugwu enweghị coronavirus - NCDC
Ngalaba na-ahu maka mbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na nyocha e mere onye eche na o nwereike buru coronavirus n'Enugwu gosiri na ya bụ nje adịghị ya n'ahụ
NCDC sị na ọ dị mkpa ichere ka emecha nchoputa tupu ndi mmadụ eburu asịrị kpagharịwa.
Cheta na akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ọ bụ otu nwaanyi si ofesi lọta ka a na-eme nyocha makana ọ na-akwa ụkwara.
N'otu aka ahụ, Dọkịnta Ifeanyi Agujiobi bụ onye odeakwụkwọ kọmịsọna ahụike n'Enugwu, site n'akwụkwọ o nyere ndị mgbasaozi, kwenyekwere n'ihe NCDC kwuru ma sịkwa ka ndị mmadụ ka na-adị ọcha ma na-agbado anya.
Buhari sị ndị mberede metụtara n'Abule Ado ka
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari etiela ndị igwe gassị gbara ka ogbunigwe na Legọs metụtara aka n'obi.
Ọ sị na NNPC na-agba mbo ịchọpụta ihe kpatara ya bụ mberede.
Ngalaba gbata gbata na Legọs kwuru na ha butere ozu mmadụ iri na asaa nwụru na ya bụ ọdachị ebe mmadu iri abụọ na ise merụrụ ahụ.
Joe Biden na Bernie Sanders zutere
Joe Biden na Bernie Sanders ji Donald Trump mere okwu ka ha zutere n'ogige achụmta vootu onye ga-ebu kọlọtọ pati demokrat zọzị ya ọchịchii n'ọnwa Novemba.
Ha abụọ sị na Trump ezughi ka emee ma ncha, ọkachasị etu o si ebuso Coronavirus agha.