You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
National Emergency toll line: Gọọmenti etiti ewepụtala ekwentị 112 maka ihe mberede ọbụla
Dị ka nke a na-eme, Onyeisiala Muhammadụ Buhari emepeela ogige ekwenti gbata gbata nke akpọro National Emergency toll free na Bekee.
Ị ga-akpọ ya bụ akara ekwenti bụ 112 n'efu mgbe ọbụla.
Akụkọ na-erụ anyị ndị na-ekwu na ọrịa Coronavirus efeela mmadụ anọ ọzọ na Legọs.
Kọmịshọna na-ahụ maka okwu ahụike bụ ọkammụta Akin Abayomi bụ onye kwupụtara nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ nwere ụbọchị Tọzde.
Nke a na-eme ya mmadụ iri na-abụọ(12) buterela ọrịa ahụ.
Cheta na ụbọchị Fraide ọ pụtara ihe na mmadụ ise ọhụrụ gụnyere nwa e ku n'aka ebutela ọrịa ahụ.
Ụlọikpe mkpegharị enyeela Ifeanyi Uba mmeri
Ụlọikpe Mkpegharị dị na-abụja ekpebiela na ọ bụ Ifeanyị Uba nke otu Pati YPP meriri na ntuliaka ọkwa Sinetọ na-anọchi Anambra-South.
Ụlọikpe kwuru na nke a bụ n'ihi na ụlọikpe e wegaburu okwu ahụ enweghị ikike ikpe ya.
Ha kwukwara na akwụkwọ a gbara ezughị oke ọkaiwu ebinyeghị ya aka nakwa enyeghị Ụba ohere ikwu ọnụ ya(fair hearing).
Cheta na ụlọikpe chụtuburu Uba n'oche Senetọ maka ebubo iji asambodo adịgboroja zọọ ọchịchị.
Anambra steeti na-atule atụmatụ ha ga-eso iji gbochie Coronavirus
Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha na-atule atụmatụ ha ga-agbaso iji gbochie ọrịa coronavirus ịbata na steeti ahụ.
Don Adinuba bụ Kọmishọna mgbasa ozi nke Anambra kwuru na ha ga-ewepụta ya bụ atụmatụ n'oge eteghi aka.
Adinuba kwuru nke a dịka akụkọ na-efesa na Anambra steeti amachiela ọgbakọ ọha mmadụ n'ihi coronavirus.
O kwuru na akụkọ ahụ abụghị eziokwu n'ihi na gọọmentị ekpebibeghị ihe ha ga-eme.
Coronavirus erubeghi nke imechi ụka - CAN Legọs
Ndị otu 'Christian Association of Nigeria' nke Legọs steeti ekwuola na ọrịa coronavirus na Naịjirịa erubeghi nke ịmachi ụlọụka.
Ha kwuru nke a n'ọgbakọ ha kpọrọ ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Wenezde.
Onyeisi otu a bụ Alexander Bamgbola kwuru na kama ịmachị ụlọụka dị icheiche, ndị isi ụlọụka ga-agba mbọ ịhụ na ha dobere ihe niile ga-enye aka igbochi ọrịa ahụ n'ụlọụka ha.
Nke a na-abịa dịka gọọmentị Legọs steeti machiri ọgbakọ okpukperechi ọbụla karịrị mmadụ iri ise.
Bamgbola kwuru sị: "Anyị nwere olileanya na ọrịa a agaghị eru nke na ụlọụka niile ga-emechi."
Ọ bụ eziokwu na mba Yurop ụfọdụ amachiela ịka ụka nakwa ọgbakọ okpukperechi mana Bamgbola kwuru na "Chineke agaghị ekwe ka o ruo etu ahụ na Naịjirịa."
Emechiela ụlọakwụkwọ niile
Gọọmentị Legọs nyekwara iwu na ụlọakwụkwọ niile ga-emechi malite n'ụbọchị Monde, abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị.
Otu a ka ọ dịkwa na Ogun, Kwara na mpaghara North-West niile, bụ ebe gọọmentị nyere iwu ka ụlọakwụkwọ mechie.
Ndị gọọmentị ọwụwa anyanwụ amabeghị ọkwa dị otu a.
Ọrịa coronavirus n'Afrịka ga-aka njọ - WHO
Onyeisi otu 'World Health Organisation' adọọla ndị ọchịchị Afrịka aka na ntị ka ha dị njikere maka nke ka njọ gbasara ọrịa coronavirus.
Ghebreyesus kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ n'abalị Wenezde.
O kwuru na coronavirus na-akpa ike na mba ndị ọnọdụ ahụike ha siri ike, nke pụtara na o nwere ike ịka njọ ma ọ gbasaa na mba Afrịka ụfọdụ na-enweghị ọnọdụ ahụike siri ike.
Ugbua, ọrịa a abanyela na mba Afrịka niile ma gbukwaa mmadụ iri na isii na mpaghara ahụ.
Na mba ụwa niile, ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus agafeela narị puku abụọ ebe mmadụ puku asatọ anwụọla.
Mana ya bụ ọrịa ebalatala na Chaịna bụ ebe o siri malite.
Ụlọakụ etiti ebupụtala ego maka ọrịa coronavirus
Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru na ha ewepụtala otu tarị naịra na ụma iji kwalite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa dịka ọrịa coronavirus ka na-akpa ike.
Emefiele kwuru na n'ime ego a, otu tarị naịra ga-abụ iji kwado ndị na-arụpụta ihe dị icheiche bụ nke ndị mmadụ ga-na azụrụ n'ihi na ngwaahịa si mba ofesi anaghịzi abata etu o si abatabu.
Otu narị ijeri naịra ka a ga-etinye na ngalaba ahụike iji nye aka igbochi ọrịa coronavirus.