Busola Dakolo: 'Nyem N10m ma rịọ m mgbaghara'

Ebe foto si, @biodunfatoyinbo/@busoladakolo
Busola Dakolo ekwuola na Biodun Fatoyinbo ga-akwụ ya 10m maka ihe ọ gabigara n'aka ya.
N'ikpe nke Busola Dakolo tinyere n'ụlọikpe ahụ o kwuru na mwakpo Biodun wakporo ya metụtara alụmdinanwunye na n'ụzọ adịghị mma.
O kwukwara na ọ chọrọ ka Fatoyinbo dere ya akwụkwọ edemede rịọ ya mgbaghara iji gosi nchegharị maka ihe o mere ya.
Ụlọikpe ukwu n'Abuja akpọọla Busola Dakolo na Onyeisi ụlọụka COZA bụ Biodun Fatoyibo oku ka ha bịa zara ọnụ ha.
Ụlọikpe ahụ nyere ha abụọ abalị iri na anọ iji gosi onwe ha ma kwuo uche ha gbasara okwu ahụ.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch siri kwuo, Dakolo kwuru na ọgụgọ niile Fatoyinbo na-agọ kemgbe o boro ya ebubo na-enyekwa ya oke nsogbu n'uche ya.
Cheta na Busola Dakolo boro Biodun Fatoyibo ebubo mmetọ n'ụzọ ezighi ezi mgbe ọ ka bụ nwa agbọghọ.





