Ọ bụ ndị na-eke ọku kpatara na ọkụ anaghị adị - Osinbajo
Akụkọ dị ọkụ n'ụtụtụ a

Ebe foto si, Getty Images
Osote Onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ọ dị mkpa ka emegharịa atụmatụ eji ewepụta ọkụ letrik na Naijirịa.
Osinbajo kwukwara na ọ bụ ndị na-eke ọkụ akpọrọ discos na nchabị ka enweghị ọkụ si n'aka.
Ọ sịkwa na agbanyeghị na a na-emepụta megawatts 8000, ọbụ nanị puku 4000 ka ndị discos a na-ekenye ndị mmadu maka enweghị akụrụmngwa ha kwesiri ịnwe.
Osote Onyeisiala kọwara na ọ bụru na-enweghị ụzọ esi ekesa ọkụ ziri ezi, nkwa na mbọ niile gọọmentị na-agba agaghi amịta mkpụru.
O kwuru okwu ya mgbe ọ na-agbape ụlọ ọrụ akpọrọ Niger Delta Poiwer Holding Company n'Abeokuta Steeti Ogun.
Nwata tọọrọ onwe ya

Ebe foto si, BBC Graphics
Nwatakịrị dị afọ iri na ise tọrọ onwe ya na Steeti Platu.
Nwatakịrị a na ndị enyi ya kpara ntaka a ka ha nwee ike nata nna ya Puku narị naira ise ha ga-eji zụta uwe ma nwee aṅụrị.
Ka o si di ụgbụa, nwata nwoke a na ndị enyi ya so kpaa nkata a nọ n'aka ndị uweojii.
N'ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Mba Nọt Korea agbajụọla n'ihe gbasatara okwu udo na etiti ha na mba Sawụt Korea.Kim Jong-un ekwuru na ocheghi na okwu udo di ndị Saut Korea mkpa maka na ha na ama ọkwa ụdo ma na egosikwa ha na ha dị njikere ma nwee ngwa agha ịbuso ha agha.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Chidozie Awaziem so Super eagles sụọ mpị n'Iko Mba Afrịrịka bụzị onye egwu bọolụ Leganes nke Spain dịka ha gbazitere ya otu afọ n'aka otu egwu bọolụ Porto nke Portugal.
Awaziem onye dị afọ iri abụọ na abụo gbaburu ndị ọmụmụ nke El Kanemi Warriors nke Naijirịa tupu o gawa Porto n'afọ 2014.











