Nọt Koriya ga-eziga osote onyeisi ha ga Saut Koriya

Ebe foto si, AFP
Onyeisi ọchịchị mba Nọt Koriya ga-aga Pyeongchang dị na Saut Koriya n'izu a maka egwuregwu Winter Olympics, ọ ga-abụ onye kachasị elu ga-esi Nọt Koriya ga Saut Koriya.
Nọt Koriya kwupụtara na Kim Yong-nam ga-aga ịhụ egwuregwu ga-ebido ụbọchị Fraidee.
Ndị mba Koriya ndị ahụ ga-aga n'okpuru otu ọkọlọtọ maka mmepe mmemme ahụ.
Nke a na-egosi na o nwereike ịbụ na mba abụọ ahụ na-enwe obi dị ala mana ndị ọkacha mara na-ekwu na ọdịụ̀hị ka mmekọ ahụ ga-enye aka gbasara ngwọagha Nukiliya ndị Nọt Koriya chọrọ.
Kim ga-anọ na Saut abalị atọ ebe ọ ga-edu mmadụ iri abụọ na abụọ we ga.

Onye bụ Kim Yong-nam?
Kim, bụ onye dị afọ iri itoolu, anọla n'ọchịchị ndị isi Nọt Koriya mmadụ atọ.
Ọ bụ onyeisiala mba ahụ mana oche ya bụ maka mmemme, ya bụ onye na-eziga ozi ọnwụ ma ọ bụ ozi ekele. Ọ bụ onye a ma ama dịka ezi onye ọrụ mba na Pyongyang.
Ọbụla onyeisi ụlọ omeeiwu Not Koriya a na-akpọ Supreme People's Assembly na bekee n'afọ 1998.
Kim Yong-nam adịghị ka onyeisiala mba ha ugbua, Kim Jong-un maka Kim Yong-nam emela njem ga mba ofesi. N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017, ọ gara mba Iran maka mmemme mwebata onyeisi ha bụ Hassan Rouhani.

Ọ gakwara mmemme mmepe egwuregwu winta olympics nke e mere na mba Russia n'afọ 2014.
A na-ekwu na Kim na-eso ọchịchị mba ya nkeọma. Onye si North Korea gafee South gwara ndị ntaakụkọ Yonhap na ọ bụ maka na o na-erube isi nye ọchịchị mere o ji ka nwee ọkwa n'obodo ahụ agbanyeghi ọchụchụ a na-achụ ndị mmadụ kwa mgbe na mba ahụ.

Ebe foto si, Getty Images









