Poisonous Tomato Paste: "Tomato a kwọrọ akwọ bụ ahia iwu na Naịjirịa" - Ndị Custom

Ebe foto si, Getty Images
Osote onyeisi "Nigerian Customs Service" bụ Anthony Ayalogu ekwuola na enweghị otu tomato akwọrọ akwọ nke agbara na mkpọ ga-esi bata Naịjirịa n'ihi na ọ bụ ahia iwu.
O kwuru nke a mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara kepukepu na-aga na Soshal Midia maka ngwa ahia tomato akwọrọ akwọ e si obodo Iran were bubata.
Akụkọ a na ekwu na ya bụ ahia sitere obodo Iran ma kwukwaa na aha ya bụ "Shirin Asal My Tomato Paste".
Ayalogu kọwara na ụdị ngwa ahia di otua enweghi ike igafe nyocha ndị Kustọms n'ihi na amachiela ya kamgbe otu afọ.
BBC jukwara ya maka ụfọdụ tomato akwọrọ akwọ gbaa na mkpọ dị n'ahia nke o saara si na ya enweghị ike iza ajụjụ ahu.
O kwukwara na ọbụrụ na kepukepu a nwere aha ugbọ mmiri bubatara ya ma ọ bụ ụbọchị ọ bataara na ha nwere ike inyọcha akụkọ a ka ha mara ma ọ bụ eziokwu.
Akụkọ ga-amasi gị :
Lee ihe nkiri ga-amasị gị.






