Nafdac ebuliela mmachi Emzor na ndị ọzọ na-ere codeine

Ụlọọrụ ndị Nafdac

Ebe foto si, NAFDAC official Facebook

Nkọwa foto, Ndị Nafdac machiri ụlọọrụ anọ maka nchọpụta BBC mere maka etu ndị mmadụ si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine ha na-arụpụta

Nafdac buliri mmachi ha machịrị ndị ụlọọrụ Bioraj Pharmaceutical Limited, Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited ka ụbọchị anọ gafechara.

Ha kwukwara na ọrụ nwekwara ike ibido ịga etu o si agabu.

Nafdac kwuru na ha na ndị isi ụlọọrụ atọ a zukọrọ n'ụbọchị Tọọsde bụ Mee 10, ebe ha nyochara mmepụta na nkesa ọgwụ nwere codeine nakwa.

Onyeisi ndị Nafdac bụ ọkammụta Mojisola Adeyeye, kpọkọrọ nzukọ a ebe ndị na-ahụ maka nyocha na mmezu iwu bụ 'Investigation and Enforcement (I&E)', ndị 'Drug Evaluation Research (DER)' na ndị 'Narcotics and Controlled Substances (NCS)' n'ụlọọrụ ndị Nafdac bidoro ya bụ nzukọ.

Dịka ha siri kwuo, ihe ha kpebiri na nzukọ a bụ na ụlọọrụ atọ a ga-ebido ịweghachite ọgwụ ndị nke ha kesasịrị, nke Nafdac ga-etinye anya ịhụ na ọ gara n'ụzọ ziri ezi.

Ka Nafdac buliri mmachi a, ha nyere iwu sị ka a kwụsị mmepụta ọgwụ codeine ozugbo ozugbo. Ha kwukwara na ha bụ Nafdac ga-etinye uchu ịhụ na ha mere ihe a gwara ha.

Na nzukọ a, Nafdac kwuru na ha agaghị enye onye ọbụla chọrọ ịtụbata codeine akwụkwọ ikike nke bekee kpọrọ 'permit' ruo mgbe ọzọ ha ga-ama ọkwa ya.

Ha rikwara ụlọọrụ atọ a iwu ha kwuru ruru iwu ndị ha dara.

Aha onyonyo, Codeine, ọtọmegbum