Presidential Election: Ihe anọ Buhari ga-emere m ka udo were chịa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa:

Ohaneze, NEF, Afenifere, MBF na NDF akwadola Atiku ịga ụlọikpe

Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Otu ọdịnala na agbụrụ dị na Naịjirịa bụ Ohaneze ndị Igbo, Northern Elders Forum, Middle Belt Forum na Niger Delta Forum etinyela aka n'akwụkwọ ịgwado Atiku ịgawa ụlọikpe maka ịlebe anya na-atụm vootu emere ụbọchị satọde nke ha kwenyere na ozighịezi.

Ndị tinyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ ndị isi otu ndị dịka Ọkamụta Ango Abdullahi, Chief John Nwodo, Chief Ayo Adebanjo, Chief Edwin Clark na Dkt. Pogu Bitrus.

Buhari sị na ihe ga-atakwu akpọ

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na Pati APC achụpụ Rochas Okorocha na Ibikunle Amosu nke Ogun steeti na pati ha.

Ndị niile BBC kpọrọ maka ịmata nke bụ eziokwu n'akụkụ a kwọchapụrụ aka na ụkwụ ha na ya bụ akụkọ.

APC achụpụla Rochas?

Rochas Okorocha

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na Pati APC akpawala nkata ịchụpụ Rochas Okorocha na Ibikunle Amosun nke Ogun steeti na pati ha.

Ndị niile BBC kpọrọ maka ịmata nke bụ eziokwu n'akụkụ a kwọchapụrụ aka na ụkwụ ha na ya bụ akụkọ.

Ndị omekome wakporo ụmụnwaanyi ebe atụrụ vootu

Nwaanyi na-azọ onwe ya ka aghara itigbu ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mpụ nwakpo na-eweta nnukwu mwute na Naijiria

Inec ekwuola na-awakporo ụmụnwaanyị bụ ndị ọrụ ngo mgbe e mere ntụlịaka onyeisiala na Satọde gara aga.

Agbanyeghị na Inec sị na udo chịrị na ọtụtụ ebe e mere ya bụ ntụlịaka mana ọgbaaghara dị n'ebe ụfọdụ nke ha akọwaghị nke ọma.

Akpabio akwụsịla Inec inye Chris Ekpenyong asambodo

Godswill Akpabio

Ebe foto si, Godswill Obot Akpabio Facebook

Sen. Godswill Akpabio kwuru na ya anatala ụlọikpe ikike ịkwụsị Inec ịnye Chris Ekpenyong nke PDP asambodo meri maka ntụlịaka ha mere ụbọchị Satọde mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ.

Akpabịọ sị na nke a ga-enye aka inyocha ihe mgbagwoju anya mere mgbe a tụrụ vootu ahụ.

Edoola nwaanyị mbụ bụ ọkaikpe iyi ọrụ n'Anambra steeti

Jọstịs Ijem Onwuamaegbu

Ebe foto si, Uche Akolisa

Nkọwa foto, Jọstịs Ijem Onwuamaegbu bụ nwaanyị mbụ bụ Okaikpe n'Anambara steeti

Gọvanọ Willie Obiano edoola nwaanyị mbụ bụ okeiwu n'iyi ọrọ.

Okiwu ndị steeti Alaigbo ndị ọzọ bịara emume a pụrụ iche n'Obi gọọmentị nke steeti ahụ.

Super Falcons 4 - 3 Solvakia

Super Falcons na France

Ebe foto si, NFF/twitter

Nkọwa foto, Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ

Otu Super Falcons nke Naịjirịa ewerela ọkpụ anọ a satara atọ merie ogbo ha ndị Slovakịa na asọmpi Cyprus Women's Cup.

Rita Chikwelu nyere goolu abụọ na ya bụ asọmpị .

Gee nkeji anyị ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

US na-achọ nwa Osama Bin Ladin

State Department's Wanted poster

Ebe foto si, Rewards for Justice

Mba Amerịka ekwuola na ha ga-enye onye ọbụla ga-enye ha ozi bara uru gbasara nwa Osama Bin Laden bụ Hamza, otu nde dọla.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ha kwuru na Hamza a na-enyo na ọ nọchiri anya nna ya dịka onyeisi otu Al-Qa'ida, na-ekwu ekwu iwakpo mba Amerịka na ndị enyi ha.

Udo Naịjirịa

Abdusalami Abubakar chịburu Naịjiria dịka onye agha, bishọp ndị ụka katọlik na Sokoto bụ Matthew Kukah na ndị ọzọ nọ n'otu kpọrọ onwe ha National Peace Committee, zutere Atiku Abubakar na Peter Obi zọrọ ọchịchị na ndị isi a hụrụ kwaba okpu nọ n'okpuru PDP, n'abalị Tọọzde.

Na nzukọ ahụ, ndị otu ahụ na-ekpe udo gwara ndị PDP ka ha chefuo maka ịga ụlọikpe gbasara mpụtara ntuliaka a, mana PDP kwuru na ha ga-aga n'ihu makana ọ bụ ihe ọjọọ ma ha ghara ịgbagha ya maka ọdịniihu Naịjirịa.

Ndị otu "National Peace Committee" a mechara gakwuru osote onyeisiala Yemi Osinbajo n'Aso Rock, ebe ha nọ nwee nzukọ gbasara ịhụ na udo dị site na ntuliaka a e mere

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Kingsley Moghalu ekwuola okwu

Moghalu zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati YPP, kwuru na o wutere ya na ntuliaka a tara isi ndị mmadụ.

O kwukwara na ọnụọgụgụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec gụpụtara na ọ bụ vootu ole a tụnyeere ya, abụghị ole o kwesịrị inweta, makana o zughi ezu.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

N'egwuregwu,

Fulham achụọla Claudio Ranieri n'ọrụ dịka onye nchịkọta ha ma tinye Scott Parker ka ọ nọchie ya ruo mgbe ha họtara onye ọzọ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ọchụchụ ya na-abịa naanị ụbọchị narị na isii e wechara ya n'ọrụ.

Gere akụkọ BBC na nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa:

Aha onyonyo, Ibeawuchi