Sniper: Tupu i fee ya na nri gee ntị

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ndị mmadụ na-atụ ụjọ ka a hụchara ihe nkiri gosiri ka a na-efe 'sniper' n'elu agwa, ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ihe nwere ike iweta nsogbu ahụike ma ọ bụrụ na a kpachaghị anya.
BBC jụrụ ọkachamara n'ihe gbasara nri bụ Taiwo Ubany, ma e nwere ihe dị njọ n'ife ọgwụ e ji egbu ahụhụ n'elu mkpụrụ nri.
O kwuru na ọ dịchaghị njọ, mana ọ na-aka mma ka ọ bụrụ onye ma anya ya (ọkachasị onye a zụrụ n'ime ya) ga-efe ya na nri.
O kwuru "enwere ọgwụ eji egbu ahụhụ nke na-adị mma ife na mkpụrụ nri ma na gburugburu ụwa, ya mere na ndị na-eme ihe gbasara nri ma na enwere ndị nke nwereike imebi ahụ, mana ebe ha ma nke a, ha makwa oke ha ekwesịghị igafe.
"Ndị ọkachamara na nri agaghị agafe oke ahụ, abịa na ndị nke na-arụpụta nri, ndị ọrụ ha bụ ihụ na ha si n'usoro iwu arụpụta ya na-abịa elenyere ha anya ịhụ na ha agafeghị oke a.
"Ị kwuo maka kemịkal ndị a na-etinye na nri, enwere usoro e ji etinye ya iji echekwa mkpụrụ nri dịka edere ya n'ahụ karama kemịkal ahụ.
"Mana enwere usoro dịka ịkụ ya mmiri were gwagbuo ya tupu e fee ya na mkpụrụ nri, nke bụ na ụtọ na isi ya ekwesịla ịpụ mgbe ọ na-erutela n'ahịa.
"Ya mere o ji dị mma ka ọ bụrụ onye a kụzirila n'usoro e ji eme ya (onye ọkachamara).
Ya mekwara e ji ekwu na ọ na-adị mma ịsa ihe nri si n'ahịa ugboro ugboro ruru atọ maọbụ anọ, tupu e sie ma rie ya.
Ụfọdụ kemịkal na-aga na nri
- "Carbide" - nke e ji eme ka ojoko (plantain) chaa achaa.
- "Sniper" - nke a na-efe na mkpụrụ nri dịka agwa na ndị ọzọ.
Ihe o nwereike ime n'ahụ
Ubany kwuru na kemịkal ndịa nwere ike ibute ọrịa kansa n'ahụ ma e mechaa, makana kemịkal ndịa nwere ihe ndị dị iche iche o na-arụ n'ahụ.
O nwekwara ike ime ka ihe Bekee kpọrọ "immune system" dị n'ahụ gị ghara isi ike, nwee ike chekwaa ahụ gị.
Etu ị nwereike isi gbanarị kemịkal na nri
- Ihe dịka agwa, a na-awụnye ose kpọrọ nkụ n'ime ya iji achụpụ ahụhụ
- Ọ na-adị mma ịsa mkpụrụ nri ugboro ugboro.
Akụkọ ndị ga-amasị gị :











