Nnamdi Kanu: Ndị agha Naịjiria jiri nwayo na-akpasu ndị otu IPOB maka nsogbu- Achalla

Aha onyonyo, Ndị agha Naịjirịa were nwayọ na-akpasu ndị otu IPOB

Onyeisi ndi otu IPOB na United Kingdom ekwuola na ndị agha Naịjirịa enweghị ihe ha achị makana ha na-achere onye na-ekwesịghị aka mgba.

O kwuru na ọkwụ ọkụ mmụọ Nnamdi Kanu kwuru bụ eziokwu mana ndị ọchịchị Naịjirịa anaghị ekwu eziokwu.

Achalla kwuru na ihe Nnamdi kanu na-achọ bụ ndị ọchịchị nye ndị Igbo ohere ka ha mee mbinye aka nke nwereonwe ha nke a na-akpo referendum.

O kwuru na ndị agha Naịjirịa amaghị ọrụ ha ọfụma makana ọ bụrụ na ha ma ha ga-eje kpọpụta ndị ọchị ehi na-egbusisi ụmụ mmadụ.

Ọ jụrụ ebe ndị agha Naịjịrịa nọ mgbe Nnamdi Kanu pụrụ na Naịjirịa.

Nnamdi Kanu na ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Cheta na ụlọọrụ ndịisiagha Naịjirịa dị n'Abuja kwuru na ha dịla njikere ị memina onyeisi otu IPOB bụ Nnamdi Kanu makana o kwuru na ọ ga-ewete ọkụ mmụọ ma ọ bata obodo Naịjirịa.

Ha kwekwara mkwa na ha ga-akwụsị onye ọbụla maọbụ otu ọbụla ga -achọ i bute ọgbaghara na Naịjirịa.

Ha nyere onye ọbụla na-ekpokoba ngwaagha maka ị ghasasi ntuliaka 2019 na ha chegharịa maọbụ ha chere ogolo aka iwu obodo ga-adakwasi ha.

Ọ bụ onyeisi Ngalaba mgbasaozi ha bụ Brig-Gen. John Agim dọọrọ aka na nti a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ maka etu ndị Naịjirịa sị emeri na atụmaatụ ha na Naijirịa na Abuja.

N'ọnụ okwu ya, nhazi 777 na-aga n'ihu, onye ọbụla bu ọkụmmụọ abata Naịjirịa mara amara na ha na nhazi 777 ga-akwatụ ya, ọsọ kwa ya ya bụrụ Nnamdi maọbụ onyeọbụla."

Agim kwuru na ọ bụ maka ndị na-achọ itisa Naịjirịa ka eji wepụta atụmaatụ 777.

O kwuru na nhazi 777 nke bidoro n'ọnwa October asatọ, egbuola ndị ekperima na oshi ruru iri atọ na ise ma nwụchie mmadụ a na-enyocha maka nrụrụaka ruru iri itoolu na asatọ.

Agim kwuru na ọ bụrụ na ha nyocha ndị a chọpụta na aka ha adịghị ọcha, ha ga-ewere ha nyefee n'aka ndị uweojii.

Akukọ ndị ga-amasị gị: