Ndị ọrụ FRCN gbanyụrụ redio n'ụbọchị 9 Julaị

Ndị ọrụ Radio Nigeria Enugwu karịrị mmadụ otu narị emeela ngagharị iwe na gburugburu Enugwu iji gosi iwe ha.
Ndị ọrụ ahụ niile yicha uwe ojii ma buru akwụkwọ edepụtara iwe ha.
Ndị a na-arụ na ngalaba "Federal Radio Corporation of Nigeria" (FRCN) nyere gọọmentị izuụka abụọ igboro ha mkpa ha.
Onyeisi ngalaba na-ahu maka ndị ọrụ a bụ RATTAWU nke FRCN Enugwu bụ Chris Agu, kwuru na ha gbara abụbọ ọrụ awa abụọ iji gosipụta nnukwu iwe dị ha n'obi.

Agu gụpụtara ihe ha na-ana gọọmentị dịka:
- Iwelitere ha ụgwọ ọnwa ha na orubere ha ndị ọzọ
- Ịkwụ ndị lara ezumike nka ego ha nakwa imebi atụmatụ "casual workers".
Onye ọzọ sokwa chịkọba ha bụ Emeka Anyalebechi bụ onye na-anọchịte anya NUJ, kwuru na abụbọ ọrụ ahụ bụ nke ịdọ aka na ntị nke ụlọọrụ FRCN niile na Naijiria mere.
Onye mgbasaozi Ndudi Chude, kwuru na ha enyela gọọmentị etiti ụbọchị iri na anọ iji gboo mkpa ha niile.
Chude kwuru na ọ bụrụ na ha emeghị otua, ha ga-abagide abụbọ ọrụ nke nnukwu ya.
Onye Zonal Director FRCN Enugwu bụ Ike Okere, kwere ndị ọrụ nkwa na ya ga-eburu ozi mkpa ha bugara gọọmentị site n'aka DG FRCN.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











