Ọ bụghị iwu ka Okoroọcha ga nzukọ ndị isi ọwụwa anyanwụ maka ndị ọchiehi - Onwuemeodo
Onye ode akwụkwọ gọọmentị Imo Steeti bụ Sam Onwuemeodo ekwuola ihe mere gọvanọ Rochas Okorocha agaghị nzukọ ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ mere.
BBC Igbo chọpụtara na gọvanọ Steeti ndị ọzọ gara mana gọvanọ Okorocha agaghị ma onweghi onye nnọchite anya na nzukọ ahụ.
N'ajụjụ ọnụ agbara Sam , o kwuru na ọ bụghị iwu na gọvanọ ga-aga nzukọ ọbụla ma akpọrọ ya ma akpọghị ya.
O kwuru na onweghi iwu machiri onye gọvanọ ịza oku ọbụla akpọrọ ya, na ọ ga-aza oku nke ọbụla ọ chọrọ ịza.
Mgbe ajụrụ Sam Onwuemeodo ma gọvanọ Okorcha ọ kwadoro mkpebi ndị gọvanọ mere na mkparịta ụka ahụ, o kwuru na ọ bụ naanị ndị gara nzukọ ga-aza ọnụ mkpebi ha mere.

O kwuru na ọ bụrụ ha chọrọ ikwu okwu banyere nke a, na ha ga-edepụta n'akwụkwọ ozi ebe ọ ga-edo ọha anya.
Cheta na ndị gọvanọ bịara nzukọ a gụnyere Dave Umahi nke Ebonyi steeti, Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu steeti, Ikem Okeke osote gọvanọ Anambra steeti na Ude Oko chukwu osote gọvanọ Abia steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









