Kedu uru Naịjirịa na-erite na CHOGM?

CHOGM

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, CHOGM nke afọ 2018 mere na Winsdor dị na England

O tebeghị aka e mechara ọgbakọ CHOGM nke 2018 mana ọtụtụ ndị Naịjiria ka na-ekwu maka ihe ndị mere ebe ahụ.

Ha akatọla ihe onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru gbasara ndị ntorobia.

Mana ụfọdụ ka a na-ajụ uru Naịjirịa na-erite na ya bụ ọgbakọ?

Maazi Sam Olisah onye ọkachamara n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị gwara BBC Igbo na onweghị uru Naịjirịa na-erite na ya bụ ọgbakọ.

O kwuru na kama onyeisiala ga-ana ga ya bụ ọgbakọ na ọ ka mma ka ọ nọdụ ala gbo mkpa ndị na-esogbu Naịjiria dika nsogbu nchekwa na agụụrụ.Onuorah kwuru na Britein bụ onyeisi CHOGM nwere ọtụtụ

nsogbu dika okwu Brexit nakwa nwakpo ndị oyi egwu nke ha ka na-achọ ka -esi egbo.

Mana onye ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta mba na mba bụ Sharkdam Wapmuk kwuru na enwere ihe ole na ole Naijiria na-rite na ọgbakọ a .

Wapmuk kọwaputara ihe ndị a:

  • CHOGM mere ka Naịjirịa laghachi n'ọchịchị onye kwuo uche ya ngwagwa.
Ị dụ n'ọkwa ọchịchị nke Goodluck Ebele Jonathan

Ebe foto si, AFP

  • Ọ na-enyere Naijiiria aka i so mba ndị ọzọ nọ na ọgbakọ ahụ ikekọrita amamihe.
Ndị na-achị mba ndị so n'otu Commonwealth

Ebe foto si, Getty Images

  • Ọ na-eme ka enwee nkekọrịta amamihe n'ihe gbasara egwuregwu.
Ndị na-achịkọta egwuregwu asọmpị Commonwealth

Ebe foto si, Getty Images

  • Ọ na-eme ka enwee nkwekọrịta nghọta n'ihe gbasara nsogbu na-akpọtụ na mbaụwa nile.
Okoloto mba Commonwealth dị iche iche

Ebe foto si, Getty Images

  • Ọ na-eme ka ha kekọrịta amamihe n'ihe gbasara Teknụzụ
Efere technụzụ

Ebe foto si, Getty Images

Teknụzụ bụ ụzọ a ga-ejinwu melite ndụ na obibi

Ebe foto si, AFP

Na ngwucha Wapmuk kwuru na tupu ndị mmadụ a sị ka Naịjirịa gbachapụ ya bụ ọgbakọ ,ekwesiri i nyocha uru niile a mara ma nke ukwu akariri nke obere uru dị na ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ