Buhari maputara otu ijeri dọla maka izụ ngwaagha

Ụgbọelu agha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndọrọndọrọ banyere otu ijeri dolla a eji a zuta ya bụ ngwaaagha bidoro n'ọnwa 2017

Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na Onyeisiala Mohammadu Buhari amapụtala ego dị otu ijeri dọla maka iji zụọ ngwaagha eji ebuso ndị na-eyi ndụ egwu agha.

Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan-Ali kwuputara nke a na-ngwụcha nzụkọ ha na Buhari nwere ụnyaahụ.

Mana ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'ọkwụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola uche ha gbasara ya bụ mkpebi.

Ngwaagha

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Akụkọ na-ekwu na Buharị maputara ego a n'azụ ndị Sineti.

Otu onye n'ime ha bụ Ike Abonyi ,onye otu patị akpọrọ PDP si na o kwetere na-ekwesiri ị gbochị ndị oyi egwu mana,

ndị nọ na ọchịchị ụgbua anaghị ekwu eziokwu.

O kwukwara na ọchịchị Buhari agaghị eji ego a wee zụta ngwaagha maka ibuso Boko Haram agha.

Gere ihe okwuru ebe a n'uju:

Aha onyonyo, 'Ndị ọchịchị Buharị anaghị ekwu eziokwu'
Ngwaagha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O teela ndị Boko Haram jị eyi ndị mmadụ egwu na mpaghara Ugwu Naijiria.

Mana onye odee akwụkwọ partị nọ n'ọchịchị bụ APC nke mpaghara Lagos steeti aha ya bụ Joe Igbokwe kwuru na Buhari ga-eji ego ahụ wee meekpa ndị oyi ndụ egwu ahụ.

O gwara ndị mmadụ na ha atụla ụjọ makana onyeisiala agaghị emefusị ego a n'ihi na ọ bụghị onye ego na-atụ n'anya .

O kwuru na APC adịghị ka PDP mefusiri ego Naịjirịa mgbe ha nọ n'ọchịchị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ