Nwata nwaanyị eburula ego ọga ya gbaa ọsọ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ebuso nrụrụaka agha ngalaba nke Enugwu steeti akpụpụla otu nwaanyị ụlọikpe make ebubo izu nde naira 3.3.
A na-ebo Florence Okorie bụ onye na-anakọ ego n'ụlọ oriri a kpọrọ Nice and Cool dị n' Enugwu.
Okorie, onye Obeagu Amechi dị n'Awkunanaw n'Enugwu rụrụ Nnaemeka Nnamani onye nwe ụlọ oriri ahụ ọrụ afọ asatọ ma na-ezupu ego nwoke ahụ n'ụlọakụ dịka nke ya.
Mgbaama gbara Nnamani nke mere ka ọ nwụchie Okorie ebe ọ na-akwụnye narị naịra atọ ego e chere na ọ bụ nke ụlọọrụ n'aha ya onwe ya n'ụlọakụ nke mere ka Nnamani kpee ya n'aka EFCC.
Nchọpụta EFCC mere gosiri na Okorie onye na-eri puku naịra asaa dịka ụgwọ ọnwa oge o bidoro ọrụ n'ụlọọrụ ahụ ewepụla ihe karịrị nde naịra itoolu(N9.7m) nke a na-eche na o jiri zụọ ala, keke, ọdọahịa nakwa ụlọ nwere ọnụmara asaa.
Oge a gụpụtara ebubo megidere ya n'ihu ọkaikpe H.O Eya nke ụloọikpe ukwu dị n'Enugwu, maka izu ihe karịrị nde naịra atọ, ọ gọrọ na ya emeghị ihe dị otu a.






