Ihe mere eji kpụpụ nwa Zuma ụlọikpe na South Africa

Ebe foto si, Getty Images
Ka ndị mba Saụt Afrịka na-enyocha onye bụbu onyeisiala ha bụ Jacob Zuma na nwa ya nwoke, ajụjụ bụ 'ụdịrị ihe a a ga-emenwu na Naịjirịa?'
Duduzane bụ nwa Jacob Zuma na-aga ụlọikpe ebe ọ ga-azara ọnụ ya gbasara ebubo mpụ na nrụrụaka ọkachasị nke metụtara ezinaụlọ Gupta bụ ndị a ma ama na mba Saụt Afrịka.
E nyere Duduzane, dị afọ 34, ihe Bekee kpọrọ 'bail', n'agbanyeghị na a tụrụ ya ịga n'ụkwụ ya oge e dubatara ya n'ụlọikpe.
N'afọ 2017, Duduzane gwara BBC na aka ya dị ọcha, na ọ naghị eme mpụ na nrụrụaka.
Ka ọtụtụ afọ gafere, Duduzane na-agọ ụkwụ ya na aka ya na o jighị ọnọdụ ya dịka 'nwa onyeisiala' etinye ego n'ezinaụlọ Gupta.
@AdvBarryRoux jụrụ ma ịtụ ya ịga a dị mkpa?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ebe @vuyo_ro na-ajụ ihe kpatara a ga-eji nwụchie ya ebe ndị kpasara ha oke nke 'apartheid' na-agagharịrị onwe ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Isi na isi: Naịjirịa na Saụt Afrịka
- E nwebeghị onye chịburu Naịjirịa a pụtara n'ihu ọha bo ebubo mpụ na nrụrụaka, ma ya fọdụzịa ịkpọpụ ụlọikpe.
- Zuma bụ naanị onye chịburu Saụt Afrịka e borola ebubo mpụ na nrụrụaka ma kpụpụ ya ụlọikpe.
- A bịa na Naịjirịa, ụmụ ndị bụbu onyeisiala enwebeghị nke a kpọtụrụla aha ya n'ihe gbasara nrụrụaka, mana Duduzane nwa Zuma na-azara ọnụ ya n'ụlọikpe maka nkea.

Na ụlọikpe kwuru ka a hapụ ya na 'bail' emeghị ka ọ laa na nta, maka na ọ ga-alaghachị n'ụbọchị 12 nke Julaị afọ a, ịzara ọnụ ya maka onye nwụrụ oge ụgbọala 'Porsche' ya na 'minibus' bụ ndị mmadụ sukọtara n'afọ 2014.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










