Role of the monarchy in the UK: Kedụ ndị so n'agbụrụ ezinaụlọ Eze mba Briten na ọrụ Eze na-arụ?

Ebe foto si, Getty Images
Eze Charles nke atọ (III) anọchiela anya nne, Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ (II) ka ọ nwụchara na Balmoral Castle mgbe ọ gbachara afọ 96.
Na mbido afọ a, Ezenwaanyị mere emume afọ iri asaa na ise 'Platinum Jubilee' ọ malitere ịchị nke mere o ji bụrụ onyeze kachasị nọtee aka n'ọcheze mba Briten.
Kedụ ihe ga-ema ugbua?
Oge Ezenwaanyị nwụrụ, ocheze ga-efe n'aka ọkpara ya bụ Charles bụbụ Ọkparaeze nke Wales.
A na-atụ anya na a ga-akpọpụta Charles dịka Eze n'ụbọchị Satọde n'Obieze St James dị na London, n'ihu ndị nze a kpọrọ 'Accession Council'.
Kedụ ọrụ Eze na-arụ?
Eze bụ onyeisiala mba UK. Mana ikike ya gbapụtara ihe ma bụrụ ihe jụpụtara n'emume, nke na-agbasoghi ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ọ ga na-anata mkpesa site n'aka gọọmentị nke ga-adị n'ime uhie e ji akpụkpọ anụmanụ mee, nke a gụnyere ozi banyere mkparịtaụka pụrụiche nakwa akwụkwọ ndị ọ ga-ebinye aka na ha.
Praịm minista na-ezutekaarị Eze n'ụbọchị Wenezde ọbụla n'Obieze Buckingham ime ka ọ mara ihe banyere ọchịchị gọọmentị.
Mkparịtaụka ndị a na-abụ n'ime ụlọ ebe a naghị agbasa ozi banyere ya.
Eze nwekwara ọrụ ndị ọzọ ọ na-arụgasị n'ime banyere ime iwu:
- Ịhọpụta gọọmentị - onye ndu pati ọbụla meriri na ntuliaka ga-awuchi n'Obieze Buckingham, bụ ebe a ga-akpọ ya oku ka e hiwe gọọmentị ọhụrụ. Eze na-ekposa ọchịchị gọọmentị tupu e mee ntuliaka.
- Mgbape Obodo na Mgbasaozi Eze - Eze ga-edu ndị omeiwu n'iyi ọrụ site n'ịgbape ọchịchị gọọmentị ahụ n'emume a kpọrọ 'State Opening ceremony'. Ọ na-ehiwe kwa ntọala gọọmentị ahụ site na mgbasaozi ọ ga-anọ n'ocheze ya mee n'ụlọ ndị ndu a kpọrọ 'House of Lords'
- Eze ibinyeaka n'iwu - mgbe ọbụla ndị omeiwu mechara iwu ọhụrụ, Eze ga-ebinyeriri aka n'iwu ahụ ka o nwee ike dị ire ma bụrụ iwu. Oge ikpeazụ a jụrụ Eze ibinyeaka n'iwu bụ n'afọ 1708

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụkwa ọrụ Eze ịnabata ndịisiala mba ndị ọzọ, izute ndị na-anọchịteanya mba ndị ọzọ bịara njem nleta na UK. Ọ bụ ya ga-ebute ihu n'ụbọchị ncheta a kpọrọ 'Remembrance event' nke a na-eme n'ọnwa Nọvemba afọ ọbụla na Cenotaph dị na London.
Eze ọhụrụ bụ onye otu Commonwealth, otu jikọtara mba 56 nnwereonwe ha site n'aka Briten nakwa mmadụ nde abụọ na ụma anọ (2.4 billion). Ọ bụ Eze bụ onyeiaiala mba anọ n'ime ndị a bụ ndị a kpọrọ 'Commonwealth realms'.
Mana kamgbe mba Barbados nwechara onwe ha n'afọ 2021, ụfọdụ mba so na 'Caribbean Commonwealth realms' chọkwara inwere onwe ha n'otu aka ahụ.
A ga-eji foto ihu Eze Charles nke atọ dochie nke nne ya n'akwụkwọ 'Royal Mail stamps' nakwa akwụkwọ ego ha, ebe ihe e dere n'akwụkwọ njirimara mba ha ga-agbanyekwa site na 'Her Majesty' bụrụzie 'His Majesty'.
Abụ njirimara mba ha bụ 'national anthem' ga-abụzi Chineke zọpụta Eze ("God Save the King").
Kedụ etu nnochiteanya a si arụ ọrụ?
E nwere usoro nnochiteanya ọchịchị n'ezinaụlọ Eze ma ọ bụrụ Eze nwụọ maọbụ rịtuo n'ọkwa. Usoro a na-egosi onye ezinaụlọ ahụ ga-anọchiteanya Eze ma ọ bụrụ ọ nwụọ maọbụ rituo n'ọkwa. Nke mbụ - na-abụkaarị nwa Eze ahụ kachasị mee okenye.
Dịka nwa mbụ nke Ezenwaanyị Elizabeth, Charles were ọkwa Eze n'ihi ọnwụ nne ya ebe nwunye ya bụ Camilla buzi Ezenwaanyị (Nwunye Eze).
E megharịrị iwu na-achị nnọchiteanya Onyeze n'afọ 2013 iji hụ na ụmụaka ndị nwoke agaghị ibute n'ihu tupu ụmụnne ha ndị nwaanyị tọrọ ha.
Onye ga-anọchiteanya Eze Charles bụ nwa ya nwoke Ọkparaeze William, onye nwetere ọkwa nna ya dịka Duke nke Cornwall. Mana ọ gaghị abụ Ọkparaeze nke Wales n'otu ntabi anya - ọ bụ Eze ga-enye ya ọkwa ahụ.
Nwa mbụ nke Ọkparaeze William bụ Ọkparaeze George bụ onye abụọ na-esote n'ocheze, ebe ada ya nwaanyị bụ Adaeze Charlotte bụ onye atọ.


Etu e si echi Eze
Emume ichi Eze bụ mgbe a na-ekpunye Eze okpu ya pụrụiche. A na-eme nke ma ọ bụrụ na eruchaa uju onye bụbu Eze.
Elizabeth nke abụọ rigooro n'ọkwa Ezenwaanyị na 6 Febụwarị afọ 1952 mgbe nna ya bụ Eze George VI nwụrụ mana e chighi ya Ezenwaanyi ruo na 2 Juun, afọ 1953.
Echiche ya bụ nke mbụ a na-agbasa n'ihie onyonyo dịka ọ na-eme mgbe ahụ, nke mmadụ karịrị nde iri abụọ (20 million) lere ya.

Ebe foto si, PA Media
Kamgbe afọ narị itoolu (900 years) ebe a na-echi echichi a bụ na Westminster Abbey - William the Conqueror bụ Eze nke mbụ, ebe Charles ga-abụ onye nke iri anọ (40th).
Nke a bụ emume ndị okpukperechi Anglican, ọ bụ Achịbishọp nke Canterbury na-ahazi echichi a.
A na-ete Eze "mmanụ nsọ", ma nye ya 'orb' na mkpanaka (sceptre) na-egosi nkwanye ugwu onyeze. N'isi njedebe emume a, Achịbishọp ga-ekpunye okpueze a kpọrọ 'St Edward's Crown' n'isi Charles - okpu eji oke ọlaedo kpụọ kamgbe afọ 1661.
Nke a bụ okpu kachasị okpu nke 'Tower of London', ọ bụ naani Eze na-ekpu ya n'oge echichi ya.
Echichi Eze a bụ echichi metụtara mba a - gọọmentị na-akwụ ụgwọ emume a ma họpụta ndị ga-abịa ya bụ emume.
Kedụ ndị ọzọ so n'ezinaụlọ Eze?

Ebe foto si, PA Media
- Duke nke Cornwall na Cambridge (Ọkparaeze William) bụ nwa nwoke mbụ nke Eze Charles na nwunye ya nke mbụ bụ Diana, Adaeze nke Wales. Ugbua ọ na-alụ Duchess nkeCornwall na Cambridge (Catherine). Ha mụru ụmụ atọ: Ọkparaeze George, Adaeze Charlotte na Ọkparaeze Louis
- Ada Onyeze(Adaeze Anne) bụ nwa Ezenwaanyị nke abụọ nakwa otu ada ya. Ọ lụrụ Timothy Laurence. Ọ mụụrụ di ya nke mbụ bụ Mark Philips ụmụ abụọ: Peter na Zara Tindell
- Earl nke Wessex (Ọkparaeze Edward) bụ nwa ikpeteazụ nke Ezenwaanyị. Ọ lụrụ Countess nke Wessex (Sophie Rhys-Jones). Ha mụrụ ụmụ abụọ: Louise na James Mountbatten-Windsor
- Duke nke York (Ọkparaeze Andrew) bụ nwa nwoke Ezenwaanyị nke abụọ. Ya na onye bụbu nwunye ya, Duchess nke York (Sarah Ferguson) mụrụ ada abụọ: Adaeze Beatrice na Adaeze Eugenie. Ọkparaeze rituru n'ọkwa ya n'ọrụ Onyeze n'afọ 2019, mgbe otu mgbasaozi na Newsnight boro ya ebubo ịwakpo Virginia Giuffre n'ụzọ idina n'ike. N'ọnwa Febụwarị afọ 2022, ọ kwụrụ ọkpụrụkpụ ego a na-akpọghị aha iji pịachie ikpe ahụ nke nwada Guiffre kpụpụrụ ya n'ụlọikpe dị n'Amerịka.
- Duke nke Sussex (Ọkparaeze Harry) bụ nwa nwoke nke William tọrọ. Ọ lụrụ Duchess nke Sussex (Meghan Markle). Ha nwere ụmụ abụọ: Archie na Lilibet. N'afọ 2020, ha kwuru na ha arịtuola n'ọkwa ọrụ ha gaa biri n'Amerịka
Kedụ ebe ndị ezinaụlọ Eze na-ebi?
A na-atụ anya na Eze Charles na Ezenwaanyị (Nwunye Eze) ga-aga biri n'Obieze Buckingham. Ha bibu na Clarence House dị na London nakwa Highgrove dị na Gloucestershire.
Ọkparaeze William na Catherine, Duchess nke Cornwall na Cambridge na nso nso si n'Obieze Kensington dị na West London ga biri n'Adelaide Cottage, dị n'ogige obibi Ezenwaanyị dị na Windsor.

Ebe foto si, PA Media
Ọkparaeze George, Adaeze Charlotte na Prince Louis gara n'ụlọakwụkwọ Lambrook dị nso n'Ascot nke Berkshire.
Ọkparaeze Harry na Meghan Markle bi na California.
Kedụ ogogo a maara ezinaụlọ Eze ruo?
Ntuliaka nke YouGov mere n'oge emume afọ iri asaa na ise (Platinum Jubilee) ọchịchị Ezenwaanyị gosiri na mmadụ pasentị 62% chọro ka ochieze ahụ gaa n'ihu ebe pasentị 22% sị ka e mee ntuliaka họpụta onyeisiala mba ahụ.
Ntuliaka abụọ nke Ipsos Mori mere na 2021 nyekwara mpụtara yiwere nke ahụ, ebe otu n'ime mmadụ ise sị na ọ ga-adị mma ka e kpochapụ ọchịchị eze na UK.
Mana YouGov chọpụtara na e nweela ọdịda na nkwado ọchichị eze n'afọ iri gara aga site na pasentị 75% n'afọ2012, ruo pasentị 62% n'afọ 2022.
Ebe nkwado ka ọchịchị eze gaa n'ihu si n'aka ndị okenye mana ntuliaka a gosiri na ọ bụghị etu ahụ ka ọ dị n'ebe ndị ntoroọbịa nọ.
N'afọ 2011, mgbe mbụ YouGov malitere nyocha a, mmadụ pasentị 59% nọ n'agbata afọ 18 ruo afọ 24 chọrọ ka ọchịchị eze gaa n'ihu ma a tụnyere ya mmadụ pasentị 33% n'afọ 2022.









