Obituary: Ezenwaanyị Elizabeth II

Ebe foto si, CHRIS LEVINE/ JERSEY HERITAGE TRUST

Otu ihe pụrụiche pụtara ihe n'ogologo ọchịchị Ezenwaanyị Elizabeth bụ ezigbo uchu ọ na-etinye n'ọrụ nakwa mkpebi ya iji ndụ ya nye ocheeze nakwa ndị obodo ya.
Ọ bụ ọtụtụ ndị mmadụ ihe nleghara anya n'ụwa ugbua na-agafe ọsịsị nke ike ndị Briten nwere dakwara, ọgbọ gbanwere nke ukwu nke ndị mmadụ bidoro ịjụ ajụjụ gbasara ihe ndị eze Briten ka na-eme.
Ihe o mekarịchara bụ ijikwa oche eze na ọchịchị eze Briten gafee ebili mmiri oge a na-agbanyeghi na oge a mụrụ ya, onweghi onye gaara ịma na ocheeze ahụ ga-abụ akara aka ya.
A mụrụ Elizabeth Alexandra Mary Windsor ụbọchị 21 ọnwa Epureel afọ 1926 n'ụlọ dị na i gafesịa Berkeley Square na London, nwa mbụ Albert, onye nlekọta a ana-akpọ Duke nke York, nwaa nke abụọ nke George V na nwunye ya bụbu nwaanyị Elizabeth Bowes-Lyon.

Ebe foto si, Getty Images

Ma Elizabeth na nwanne ya nwaanyị bụ Margaret Rose bụ onye a mụrụ n'afọ 1930 gụrụ akwụkwọ n'ụlọ ma too n'ezinaụlọ nwere ịhụnanya. Elizabeth na-anọ nna ya na nna ya ochie bụ George V nso oge ọbụla.
Oge ọ dị afọ isii, Elizabeth gwara onye na-akụzi ya etu e si anya inyinya na ya chọrọ ịbụ "nwaanyị ime obodo nwere ọtụtụ ịnyịnya."
E kwuru na ọ bụ nwata mara ihe kamgbe ọ na-eto eto. Winston Churchill bụ onye chịrị n'ọdịnaihu kwuru na ọ nwere "agwa bu ikike na-atụ n'anya o nwere kamgbe ọ bụ nwata."

Agbanyeghi na ọ gaghị akwụkwọ, Elizabeth gosipụtara na ọ ma asụsụ ma gụọ ndekọ gbasara akwụkwọ iwu nke ukwuu.
E mepụtara otu pụrụiche a kpọrọ "Girls Guide Company" na bekee n'ụlọeze Buckingham ka o wee nwee ike soro ụmụnwaanyị ndị ọgbọ ya mee ihe.
Ọgbaghara biliri
Dịka George V nwụrụ n'afọ 1936, ọkpara ya a na-akpọ David bụrụ Edward nke VIII
Kama na onye ọ họrọ dịka nwunye ya bụ onye Amerịka hapụrụ di ugbo abụọ aha ya bụ Wallis Simpson bụ onye e kwuru na o rughi eru na ndọrọndọrọ nakwa n'ụka. Na ngwụcha afọ, ọ rịturu n'ọkwa.
Onye na-achọghị ọkwa bụ Duke York mechara bụrụ eze George nke VI. Echichi ya gosiri Elizabeth ihe chere ya n'ihu ebe o mechara dee na ya hụrụ ọrụ ya dịka "ihe dị ebube".

Ebe foto si, Getty Images

N'ihu mmekpa ahụ na-arị elu na mpaghara Yurop, eze ọhụụ ahụ na nwunye ya jikọrọ aka ọnụ kpebie iweghachite okwukwe ndị mmadụ nwere n'oche eze ha. Nwa ha nwaanyị atụfụghikwa agwa ahụ.
N'afọ 1939, adaeze ahụ dị afọ 13 dugara Eze na Lọọlọ ya gaa ụlọakwụkwọ ndị na-alụ agha mmiri dị na Dartmouth.
Otu nwaakwụkwọ dugharịrị ya na nwanne ya nwaanyị na nwa nwanne nna ya bụ Ọkparaeze Philip nke Greece.
Ihe ịmaaka n'ihu
Ọbụghị mbụ ha na-ezute mana ọ bụ mbụ ọ na-eleru ya anya.
Ọkparaeze Philip na-akpọ ụmụnne ya ndị eze oge ọ lara ezumike n'ụlọakwụkwọ ma n'afọ 1944 oge ọ dị afọ 18, o gisiri nke ukwuu na Elizabeth hụrụ ya n'anya. O debere foto ya nime ụlọ ya ebe ha na-edekọta akwụkwọ.
Ya bụ adaeze sonyere ndị 'Auxiliary Territorial Service' (ATS) n'aha ịchafụ oge agha na-abịa na njedebe ebe ọ na-amụ etu e si anya ụgbọala ma mezikwa ụgbọala buru ibu.

Ebe foto si, PA

Ụbọchị VE, o sonyere ezinaụlọ ndịeze n'ụlọeze Buckingham na puku mmadụ ndị ọzọ gbakọrọ maka mmemme ngụcha agha.
"Anyị jụrụ nne na nna anyị ka anyị enwere ike ịpụ gaa hụrụ onwe anyị" dịka o chetara. "Echetara m na nnukwu ụjọ nọ na-atụ anyị na ndị mmadụ ga-achọpụta ndị anyị bụ. Echetara aka ọtụtụ mmadụ n'agbada Whitehall, anyị niile sonyere n'ọṅụ ahụ nakwa nwereonwe."
Ka a lụsịrị agha, ebumnuche ya ịịlụ Ọkparaeze Philip nwere ụfọdụ ihe ịma aka n'ihu.
Eze ekwetaghị ịhapụ nwa ya ma Philip mechara gafee nsogbu aka a na-atụ ya agaghị anabata ya.
Ọnwụ nna ya
Mana ebumnuche ha meriri, ụbọchị 20 ọnwa Nọvemba 1947, ha abụọ lụrụ onwe ha na Westminster Abbey.
Onye nlekọta Edinburgh ka Philip mechara bụrụ ma bụrụ ezi onye ọrụ agha. N'obere oge e wegara ha Malta pụtara na di na nwunye ahụ nwereike inwe ndụ nke ha.
Ha mụrụ nwa mbụ ha bụ Charles n'afọ 1948, nwanne ya nwaanyị Anne sotere ebe a mụrụ ya na 1950.
Mana maka na Eze agabigala ụfọdụ nsogbu n'oge agha, o nwere ọrịa kansa nke akpa ume nke osise anwụrụ kpatara.
N'ọnwa Jenuwarị afọ 1952, Elizabeth dị afọ 25 oge ahụ na Philip mere njem gawa mba ofesi. Onye Eze nke ndị dọkịnta na-ekwenyeghi gawara ịdupu di na nwunye ahụ. nke ahụ bụ ikpeazụ Elizabeth hụrụ nna ya.

Ebe foto si, AFP
Elizabeth nụrụ maka ọnwụ Eze oge ọ nọ n'ebe egwuregwu dị na Kenya ma laghachi london ozigbo dịka Ezenwaanyị ọhụrụ. O mechara cheta oge ahụ.
"N'otu ụzọ, enweghi m oge ịmụ ọrụ. Nna m nwụrụ n'ezigbo oge ya bụ, ọ bụrụ m ihe ọhụrụ ịrụ ọrụ a ma rụta ya nke ọma."
Ọstralia na Nu Ziland
E gosiri mmemme echichi ya n'ọnwa Juunu 1953 agbanyeghi na onyeisiala oge ahụ bụ Winston Churchill ekwetaghị, mana nde mmadụ gbakọrọ n'akụkụ TV ha, ọtụtụ n'ime ha bụ mbụ ha na-ele ya ka ha hụ Ezenwaanyị Elizabeth II ebe ọ na-aṅụ iyi.

Ebe foto si, Fox Photos/Getty Images

Dịka mba Briten ka na agabiga nsogbu agha mbaụwa butere, ndị mmadụ chere na echichi ya ga-eweta ihe ọchịchị Elizabeth ọhụrụ.
Agha mbaụwa nke abụọ biri ike na ọchịchị Briten ma oge Ezenwaanyị ọhụrụ ahụ malitere ime njem ịga mba ndị nọ na Commonwealth n'ọnwa Novemba afọ 1953, ọtụtụ mba Briten jibu anatala nwereonwe nke gunyere Ịndịa.
Elizabeth bụ onye eze mbụ nọ n'ọkwa gara mba Ọstralia na Nu Ziland. E kwuru na i kee mba Ọstralia ụọ atọ, abụọ n'ime ha pụtara hụ ya n'onwe ha.
N'oge 1950 niile, ọtụtụ mba ndị ọzọ weturu ọkọlọtọ njikọ ha ma mba na obodo ebe ha ji jiri aka ha bịakọta ọnụ dịka otu mba.
Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chere na Commonwealth ọhụrụ nwereike ịdị ike ka mba mpaghara Yurop bidoro ọhụụ bụ 'European Economic Community' n'aha bekee, atụmatụ Briten wezugara mba ahụ na mpaghara ahụ.
Mgba onwe
Mana ihe mere ọdịda ikike Briten ji dị ọsịsọ bụ agha Suez n'afọ 1956 oge o were anya na mba Commonwealth enweghi ike ikpokọta ọnụ mee ihe n'oge nsogbu.
Mkpebi iziga ndị agha Briten ka ha kwụsị egwu ndị Egypt yiri iji were ọdọ Suez mechara ha ahapụ nke mere onyeisiala ANthony Eden jiri rituo n'ọkwa.
Nke a tinyere Ezenwaanyị na nsogbu ndọrọndọrọ. Otu pati ndị Kọsavetiv enweghi ụzọ ha si ahọpụta onye ọchịchị ọhụrụ mana dịka ha mechara mkparịtaụka, Ezenwaanyị kpọrọ Harold Macmillan ka o bido gọọmentị ọhụrụ.
Ezenwaanyị nwetakwara mgba site n'aka Lord Altrincham. N'otu edemede, o kwuru na ụlọikpe ya bụ naanị maka ndị ọgaranya na ọnaghị ekwuli okwu ọbụla na-ejighi akwụkwọ e dere ede.
Ihe o kwuru bolitere uzu n'etiti ndị ntaakụkọ mana otu onye ndị na-akwado Ezenwaanyị wakporo Lord Altrincham n'ụzọ.
Agbanyeghi nke a, ihe ahụ gosiri na etu ndị mmadụ si ahụta ndị eze Briten agbanwela ebe ha na-ajụ ọtụtụ ajụjụ.
Site 'n'onyeeze' gaa 'ezinaụlọ ndị eze'
Dịka ike gwụrụ Ezenwaanyị etu ndị ikpe ya si eme, di ya kwadoro ya ka o webata ụzọ ọgbara ọhụrụ.
Ha kwụsịrị ịnabata ndị mmadụ n'ụlọikpe dịka aga 'Ndị eze' jiri nwayọọ pụọ ebe e jiri 'Ezinaụlọ Eze' nọchie ya.

Ebe foto si, Terry Disney/Getty Images
Ọzọkwa, Ezenwaanyị nwetara onwe ya n'etiti nsogbu ndọrọndọrọ n'afọ 1963 oge Harold Macmillan rituru dịka onyeisi ọchịchị. Mana dịka ndị pati Kọnsavetiv enwebeghi ụzọ iji họpụta onye ọchịchị, ọ họpụtakwara Earl nke Ụlọ ka ọ nọchie ya.
Oge ahụ siere Ezenwaanyị ike maka na nsogbu bụkarịsịrị ma ọchịchị ya adị n'akwụkwọ iwu na ka e kewaa ọchịchị site na ndị eze.
Ezenwaanyị ghọtara ikike ya ịmụta, ịdụ ọdụ na ịdọ aka na ntị mana ọ gafeghi ndị a.
Nke a hụ bụ ikpeazụ a na-edewe ya n'ụdị ọnọdụ ahụ. Ndị kọnsavetiv mechara wezuga ụzọ omenaala ochie ma hazie ụzọ iwepụta ndị ọchịchị.
Ọnọdụ umeala
Na ngwụcha afọ 1960, ụlọeze Buckingham ekpebiela igosipụta ezinaụlọ eze dịka ndị a ga-abịali nso.
Nke a mere e ji mee ndekọ onyonyo nke a kpọrọ 'Royal Family'.
E nyere BBC ohere isete ezinaụlọ Windsor n'ụlọ. E nwere foto ezinaụlọ ahụ ebe ha nọ na oriri, ebe ha na-akwado mmemme ekeresimesi, ka ha na-akpọpụ ụmụ ha na ihe ndị ọzọ niile mmadụ efu na-eme ndị mmaọ̄ụ ahụbeghi ha na-eme na mbụ.
Mana ndị nkatọ kwuru na ya bụ ihe onyonyo nke Richard Cawston mere mebiri ihe omimi nke ndịeze ebe o gosipụtara ha dịka mmadụ efu, gụnyere otu ebe Duke Edinburgh na-ahụ anụ n'ala Balmoral.

Mana ihe onyonyo ahụ gosipụtara ka ha na-ezu ike nke weghachitere okwukwe ndị mmadụ nwere ebe ha nọ.
N'afọ 1977, e mere mmemme afọ iri abụọ na ise ebe ndị mmadụ nwere ọṅụ nke ukwuu na mbara ala ha. Ezinaụlọ eze nwere nchekwa etu dị mmadụ si eleta ha ma hụụ ha n'anya nke a na-ekele Ezenwaanyị maka ya.
N'afọ abụọ na-eso ya, Briten nwere Margaret Thatcher bụ onyeisi ọchịchị nwaanyị nke mbụ. E kwuru na mmekọ n'etiti Ezenwaanyị na onyeisi ọchịchị ha abụọ bụ nwaanyị nwere etu o si aga.
Asịrị na ọdachi
Otu ebe siri ike bụ ịhụnanya Ezenwaanyị nwere ebe mba Commonwealth nọ nke ọ bụ onyeisi. Elizabeth mara ndị ndu Afịrịka nke ọma ebe ọnọdụ ha na-emetụta ya.
E kwuru na etu Thatcher si emeso ha omume amasịchaghị Ezenwaanyị, otu n'ime ha bụ na onyeisi ọchịchị akwadoghi ka a taa ndị Sawụtụ Afịrịka ahụhụ maka apartheid.

Ebe foto si, PA
Ka afọ na-aga, ozi ọha nke Ezenwaanyị gara n'ihu. Oge agha Gulf gasịrị n'afọ 1991, ọ gara mba Amerịka ịbụ onyeeze Briten nke mbụ ga-agwa ndị omeiwu US okwu. Onyeisiala George HW Bush kwuru na ọ bụ 'enyi nwereonwe karịa ka ọ ga-echetali.'
Mana otu afọ na-eso, ụfọdụ asịrị bidoro imetụta ezinaụlọ ndịeze.
Nwa Ezenwaanyị nke abụọ bụ Duke York ba nwunye ya bụ Sara kewara ebe alụm di nke Adaeze Anne na Mark Philips kewakwara.
E wee gosipụtakwa na alụm di Adaeze na ọkparaeze nke Wales mechara kewaa.
Afọ ahụ mechara hụụ nnukwu ọkụ gbara n'ụlọ kachasị Ezenwaanyị mma bụ ụlọ Windsor.
Nke ahụ dịka o gosiri n'ezie ezinaụlọ eze nọ na nsogbu. Akụkọ ndị mmadụ na-akọ ma ọ bụ ụtụ isi ndị mmadụ ka ọbụ Ezenwaanyị ga-akwụ ụgwọ mmezi ya enyeghi aka.
Ugwu n'etiti asịrị dị n'ọha
Ezenwaanyị kwuru na afọ 1992 bụrụ ya ajọ afọ oge ọ na-ekwu okwu na London nke o kwuru na ha kwesiri inwe ndịeze ga-egosipụta onwe ma na ndị ntaakụkọ kwesikwara iji nwaanyọ.
"Enweghi obodo, eze, maọbụ ihe ọbụla a ga-eguzobe ga na-ele anya ka ndị na-akwadọ ha ghara inyocha ha ma ya bụrụ ndị na-adịghị akwado ha. Mana anyị niile so n'agbụrụ nke ala anyị niile ma nyocha ahụ ga-adịlị nwayọọ n'etiti nghọta na iji nwayọo."

Ebe foto si, AFP
Ọchịchị ndịeze ahụ nọ na-aghọrọ onwe ha oge niile. E mepere ụlọ Buckingham nye ndị mmadụ iji nweta ego imezi ụlọ Windsor ebe e kwuru na Ezenwaanyị na Ọkparaeze Wales ga na-atụ ụtụ isi n'ego ha ji achụ ego.
N'ofesi, olileanya ndị Commonwealth dị elu nke ukwuu na mbido ọchịchị ya mana omezubeghi. Briten gbakutere ndị otu ya ochie azụ ma nwee mmekọ ọhụrụ n'etiti ha na Yurop.
Ezenwaanyị ka hụkwara ezi ihe na mba ndị Commonwealth ma nwee oke ọṅụ oge Sawụtụ Afịrịka ebe o toro tufuru apartheid. O jiri njem ọ mere n'afọ 1995 wee ṅụrịa ọṅụ.
N'ụlọ, Ezenwaanyị na-ejikwa ugwu ezịnaụlọ ndị eze ebe ndị mmadụ na-ajụ ma ụlọ ahụ enwere ọdịnaihu.
Ọnwụ Diana, Adaeze Wales
Dịka Briten na-agba mgba ịchọta ụzọ ọhụrụ, Ezenwaanyị gbalịrị ịbụ onye ndị mmaọ̄ụ ga-elegara anya oge ha na-eru uju. Ihe tụkarịrị ya n'anya bụ etu ala niile si kwadoo ha.

Ebe foto si, PA
Mana, ala ọma jiji dakwasịrị ndị eze ebe Ezenwaanyị na onwe kpọtara onwe ya nkatọ oge Diana, Adaeze Wales nwụsịrị na ihe mberede okporo ụzọ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 1997.
Dịka ọha niile ji flawa na-ezụkọ n'akụkụ ụlọeze na London, ọ dịka Ezenwaanyị enweghi ike igosi ike ọ na-adị egosibu na mbụ ma o nwee ihe ọdachi dara.
Ọtụtụ ndị nkatọ ya aghọtaghị na o si n'oge mgbe aanaghị egosipụta uru uju n'ọha nke o gosipụtara oge Diana nwụrụ.
O mekwara ka nne ochie nwere ịhụnanya dịka ọ na-akasị ụmụ Diana obi n'ime ụlọ ezinaụlọ ya.
O mechara mee mgbasaozi nyee ala ha niile ma kwanyere nwunye nwa ya ugwu ma mee mkpebi nke ezinaụlọ ya niile ga-eso.
Ihe furu efu na mmemme
Ọnwụ nnekwu Ezenwaanyị na Adaeze Margaret n'afọ 50 nke Ezenwaanyị n'afọ 2002 mere ala niile jiri mee mmemme maka ọchịchị ya.
Agbanyeghi nke a nakwa ọgụ ha na-alụ kwa mgbe kwa mgbe maka ọdịnaihu ọcheeze ha, ihe ruru mmadụ nde bịakọtara n'ihu ụlọeze Buckingham na mgbede mmemme afọ iri ise ya.

Ebe foto si, PA
N'ọnwa Epurel afọ 2006, ihe karịrị puku mmadụ bịara n'ụlọ Windsor dịka Ezenwaanyị gagharịrị oge ọ gbara afọ iri asatọ.
Nakwa ọnwa Nọvemba afọ 2007, ya na Ọkparaeze philip mere mmemme alụ di na nwunye ha gbara afọ 60, ha jiri ụka nke ihe ruru mmadụ 2,000 bịara na Westminster Abbey.
E nwekwara oge ọṅụ ọzọ n'afọ 2011 oge Ezenwaanyị gara agbamakwụkwọ nwa nwa ya bụ William bụ Duke Cambridge na Catherine Middleton.
N'ọnwa Mee, ọ bụrụ onyeeze Briten nke mbụ gara mba Ireland nke pụrụiche.
N'okwu ya nke o jiri asụsụ Irish bido, ọ kpọrọ ka ndị mmadụ na-anagide ibe ha ma ihe o kwuru bụ "ihe ndị anyị chere a gara imegharị maọbụ emegharịghị."
Refarandum
Ka otu afọ gasịrị, na njem o mere gaa Nọtan Ireland nke so na mmemme nke Diamond ya, ya na onye bụbụ onyeisi IRA bụ Martin McGuiness kwere n'aka.
Ọ bụ oge pụrụiche nye Ezenwaanyị onye ndị IRA ji ogbunigwe gbuo nwanne ya bụ Lord Louis Mountbatten n'afọ 1979.

Ebe foto si, PA
Mmemme nke Diamond kpọtara ọtụtụ puku narị mmadụ n'ụzọ ma bụrụ mmemme e mere na ngwụcha izuụka niile na London.
Ntuliaka nwereonwe nke Scotlan n'ọnwa Sepụtemba afọ 2014 bụ oge ọnwụnwa nye Ezenwaanyị. Ụfọdụ echefuola okwu ọ gwara ndị omeiwu n'afọ 1977 ebe o kwuru na ya na-etinye uchu n'alaeze jikọrọ ọnụ.
"Eso m na ndị eze na ezenwaanyị nke Ịngland na Scotland ma ọkparaeze Wales na ndị nna nna m nke pụtara na aghọtara m ihe a. Mana agahị m echefu na e mere m eze ala niile kpokoro ọnụ nke Gret Briten na Nọtan Ireland.
N'okwu ọ gwara ndị mmadụ na Balmoral n'abalị tupu e mee ntuliaka nwereonwe Scotland, o kwuru na ya na-ele anya na ndị mmadụ ga-eche echiche maka ọdịnaihu.
Ozugbo e kwupụtara mpụtara ntuliaka ahụ, okwu ọ gwara ọha gosiri na o kuru ume ndụ na ha ka dị n'otu mana ọ kwukwara na ala ndọrọndọrọ ha agbanwela.

Ebe foto si, Richard Stone

"Ugbua dịka anyị na-aga n'ihu, anyị ga-amata na agbanyeghi echiche anyị niile nke anyị gosipụtarala, anyị nwere otu ihe bụ ịhụnanya Scotland, bụ otu ihe na-ejiko anyị niile."
Ụbọchị 9 ọnwa Sepụtemba afọ 2015, ọ bụrụ onyeeze mba Briten chịkarịsịrị, gafee ọchịchị Ezenwaanyị Victoria. O kweghi ime ya nnukwu ihe dịka o kwuru na ọkwa ahụ abụghị ihe ọ leburu anya ya.
Agbanyeghi na ọcheeze ha esighi ike na ngwụcha etu ọ dị na mbido, ọ kpebiri na ha ga aganihu inwe ịhụnanya n'obi ndị mmadụ mba Briten.
Na mmemme afọ iri abụọ na ise ya, oc hetara nnkwa o kwere oge ọ gara Sawụtụ Afịrịka afọ 30 gara aga.
"Oge m dị afọ 21, enyere m ndụ m ịrụrụ ndị m ọrụ mana arịọrọ m Chukwu ka o nyere m aka imezu iyi ahụ m ṅụrụ. Agbanyeghi na m ṅụrụ iyi ahụ n'ụtụtụ ndụ m, enweghi m ụta, agahị m eweghachi okwu m ka ma otu."





