King Charles III: Mgbasa ozi mbụ o mere dịka Eze

Mgbasa ozi Eze Charles nyere ndị mba Briten na mba ndị Commonwealth:
"Ọ bụ obi nwute ka m ji agwa unu okwu taa. Nandụ ya niile, Ezenwaanyị, Nne m ọma - bụ onye eji ama atụ na onye a na-elekwasị anya nyere ndị ezinụlọ anyị niile.Anyị enweghịike ịkwụchịha ihe ọ mere anyị dịka nne anyị; ihunanya ya, etu o siri edu anyị, nghọta ya na-etu o si amara anyị atụ.
" Eze Nwaanyị Elizabeth biri ezigbo ndụ, ọ mezụrụ nkwa ọ kwere akaraka ya nke mere na anyị na-eru uju ya ebe ọ dị ukwu".
" Nkwa ọ kwere iji ndụ ya rụọrụ ndi mmadụ ọrụ ka m na ekwere unu taa. Agbanyeghị na anyị na ọtụtụ ndị United Kingdom, mba ebe Eze Nwaanyị bụ onyeisiala ha, otu mba ndị Commonwealth, mba ụwa niile na-eru uju, anyị nwekwara obi ekele maka etu nne m, Eze nwaanyị siri rụọrọ ndị mba ọrụ."
" N'afọ 1947 mgbe ọ dị afọ iri abụọ na otu ka ọ gwara ndị ụwa na mgbasa ozi ọ mere na Cape Town nye otu mba Commonwealth na ọ ga-eji ndụ ya, ma ọ bere mpe ma o toro ogologo rụọrọ ndị mba ya ọrụ".
" Nke a karịrị nkwa: Ọ bụ okwu o jiri wepụta onwe ya nke soro ndụ ya niile.
"Ọ ji ndụ ya chụọ site n'ọrụ ya. Itinye uchu na ọrụ ya agbanweghị agbanyeghị na ọ bụ onye Eze. Oge mgbanwe, oge ọganihu, oge ọṅụ na oge ihe nwute na efu.
"N'oge ọ na-arụ ọrụ ya, o gosiri ihunanyama ogosighị ụjọ nke mere ka anyị bụrụ oke mba.
"Ihunanya na nsọpụrụ bụ ihe eji mara ọchịchị ya. Ma dịka ndị ezinụlọ anyị niile ga-ekwu, o ji ọbị ọma, obi ọṅụ na ịhụta ọdịmma dị n'ime ndị mmadụ were rụọ ọrụ a
" A na m a sọpụrụ uche nne m ma na-asọpụrụ ọrụ niile ọ rụrụ. A ma na ọnwụ ya mere ka unu na-eru uju, kama enweghị onye na-eru uju karịa mụ.
"Mgbe Eze nwaanyị batara n'ọchịchị mba ụwa ka sị na agha zuru ụwaniile nke abụọ na-apụta.
"N'ime afọ iri asaa anyị abụrụla ndị nwere ọtụtụ omenala na okpukperechi.
"Ntụala ọchịchị mba agbanweela, kama n'ime mgbanwe ndị a, ihe ịma aka ndị a, a na m eti onwe aka n'obi na-ekwu na ntụala anyị agbanweghị kama ọ kwụsịrị ike..
"Ọrụ nchekwa obodo dịka onye Eze dị, dịka ọrụ ịchakwa Ụka nke Church of England bụ nke m gbara mgborgwu n'ime ya.
"Ya bụ okwukwe mere ka m mụta oke na ọrụ m ebe ndị ọzọ nọ na nkwanye ugwu dịịrị omenala na-akụkọ mgbe ochie anyị nakwa usoro ọchịchị gọọmentị.
"Dịka Ezenwaanyị mere, mụ onwe m na-ekwe nkwa iji ndụ m fọrọ nke Chineke ga-enye m were kwado iwu niile bụ ebe mba anyi hiwere isi".
"Ebe ọbụla onye nọ, maọbụ na United Kingdom ka ọ bụ na mba ọzọ n'ụwa, agbanyeghị ebe isi na nkwenye gị, agagha arụ orụ n'irube isi, nkwanye ugwu na ihunanya dịka m si eme kemgbe ndụ".
"Nke bụ eziokwụ bụ na agaghịzị m enwe ohere ịrụ ọrụ obiebere m na-arụbu dịka ọ dị na mbụ, maka na ndụ m ga-agbanwe. Mana A m na dị m hanyere ya bụ ọrụ n'aka agaghị ekwe ka ọ daa".
"Ugbua bụkwa mgbe oke mgbanwe na ndụ m. A tụkwasara obi n'aka nwunye m m hụrụ n'anya bụ Camilla. Iji gosi na mara mkpa ọ na-egboro m kemgbe anyị nụrụ afọ isi na asaa agara aga, ọ ga-echi ya Ezenwaanyị m.
A ma na ọ ga-eji uchu na ntachị obi na uchu ahụ o jiri akwado kemgbe rụọ ya bụ ọrụ.
"Dịka onye ga-anọchị anya m, William ga-abụzị Duke nke Cornwall, echichi scọtlandị nke m ji kemgbe ọgụ afọ ise ugbua bụ nke dị masịrị m. Ọ ga-amalite ịrụ ọrụ dịka Duchy nke Cornwall".
"Taa, aga m echikwa ya Prince of Wales, Tywysog Cymru, echichi obodo nke na-atọ ụtọ ịza.
"Ya na nwunye ya, Catherine ga abụzị Prince and Princess nke Wales ọrụ nke ga-nyere ha aka ịwepụta okwu ndị enweghị nkwuwe okwu n'ọgbọ ka e tinye ya ọnụ.
"A chọkwara ịwere ihụnanya m nye Harry na Meghan dịka ha nọ mba ofesi na-ebi ndụ ha.
"Ọgachaa ihe dịka otu izu, anyị ga-ezukọ dịka mba, common wealth nakwa ụwa niile ịkwanyere nne m ukwu nke ịkpeazụ. Dịka anyị ka na-eru uju, aka anyị dọrọ ike na agwa ya.
N'aha ezinaụlọ, a na ma ekele ndị niile zitere anyị ozi iti aka n'obi.
Ozị ụnụ baara m n'obi karịa ka m nwereike ịkọwa.
"Nke a ka m ga-agwa nne, dịka ị na-amalite nje m ị ga jekwuru nna, ihe m nwereike ịgwadebe gị bụ, daalụ. Daalụ maka ịhụnanya na nkwado gị.












