Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ: Nkwado maka nkwanye ugwu ikpeazụ na akwamozu ya

Ezenwaanyị anwụọla nke biri ọchịchị kacha dị ogologo na mba Briten.
Ọ nwụrụ n'udo dịka ezịnụlọ ya gbakọtara n'akụkụ ya n'obi ya dị na Balmoral, Scotland.
N'ụbọchị olemole na-abịa abịa, lee ihe a na-atụ anya ga-eme n'emume nkwanye ugwu nke ikpeazụ ya dịka mba Briten na-akwado ikwanyere ugwu pụrụiche.
Nkwanye ugwu ikpeazụ nke Ezenwaanyị
E bubata akpati ozu ya na Lọndọn, a ga-edobe ya n'ama Westminster Hall ruo ụbọchị anọ tupu e lie ya nke a bụ iji nye ọha ohere ikwanyere ugwu nke ikpeazụ.
Ama ebe a ga-edobe ya bụ akụkụ obi Westminster kacha dị ochie nke dị n'etiti obi gọọmentị mba Briten.
Onye ikpeazụ n'ezinụlọ ndị Eze e dobere ebe n'ama ahụ bụ Nne Ezenwaanyị n'afọ 2000 mgbe ihe karịrị mmadụ 200, 000 kwụụrụ n'ahịrị bịa kwanyere ugwu nke ịkpeazụ dịka ha gbara ozu ya nkiri.

A ga-edobe akpatị ozu Ezenwaanyị n'elu ọkwa dị elu a na-akpọ 'catafalque' n'okpuru ụlọ nke ama ahụ dị ochie ruo ọgbara ochie '11th Centuary'. Ndị agha na-eche ndị ezinụlọ Eze nche ga-echekwa akụkọ anọ ebe e debere ozu ya.
Ndị agha nakwa ezinụlọ ndị Eze ga-eji nwayo nwayo dubata ya n'ime ama nke Westiminster Hall.

Ndị mmadụ ga-enwe ohere hụ ebe a ndị a kwụ n'ahịrị na-eduba ya dịka ha ga-agafe ama ebe ndị mmadụ juru nakwa dịka aga na-egosi ihe n'eme n'ihe onyonyo ga-agba n'akụkụ mba Lọndọn dị iche iche.
E bubata akpati ozu ya n'ama Westminster Hall, a ga-eji akwa pụrụiche nke ndị Eze wụchie akpati ozu ahụ dịka a ga-atụkwasị okpu Ezenwaanyị ya nakwa ọla njirimara ikike ya n'elu akpati ahụ.

E dobecha akpatị ozu ya n'akụkụ ama ahụ , aga aka ụka nwa mgbe nta tupu e nye ọha ohere ịbata ama ahụ.
Kedụ mgbe a ga-akwa ozu Ezenwaanyị?
A na-atụ anya na a ga-akwa ozu Ezenwaanyị na Westminster Abbey n'izu ụka abụọ na-abị abịa mana amabeghị ụbọchị nke a ga-abụ kpọm kwem dịka a na-eche ozi ga-esi n'obi ya nke Buckingham pụta.
Ụka abbey bụ ụka ebe ọtụtụ ihe pụrụiche merela n'ime ya nke gụnyere emume ichi ndị Eze na ndị Ezenwaanyị echichi ha nke gụnyere echịchị Ezenwanyị e mere na 1953 nakwa agbamakwụkwọ ya na Nwaeze Philip na 1947.

Ebe foto si, Getty Images
A kabeghị ụka akwamozu onye ọchịchị ọbụla n'ụka Abbey kemgbe gboo agbanyeghị na a kara ụka akwamozu nne Ezenwaayị ebe ahụ n'afọ 2002.
Ọtụtụ ndị isi ala dị iche iche ga-esi akụkụ ụị̀a niile febata dịka ha ga-esonye ezinaụlọ ndị Eze mee mmeme ncheta ndụ Ezenwaanyị. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na mba UK nwere agba nakwa ndị bụbu praịm minista ga-esonyekwa n'emume a.
Emume ụbọchị ahụ ga-amalite mgbe ndị agha mmiri na-echekwa ezinụlọ ndị Eze ga-ebu ihe inyinye gbe ukwu bupụta akpatị ozu Ezenwaanyị n'ama Westiminster ma buga ya na Westminster Abbey.

A hụrụ inyinye ibu egbe ukwu ahụ ikpeazụ n'afọ 1979 mgbe a na-akwa nwanne nna Ọkparaeze Phillip bụ Lord Mountbatten, nke ndị ọrụ mmiri si n'agha mmiri ruru otu narị na iri anọ na abụọ kpụ ya aga.
Ndị okennye n'ezinaụlọ Ezenwaanyị gụnyere Eze ọhụru nwereike i so ya n'ahịrị.
Dean nke Westminster akpọrọ David Hoyle bụ onye nwereike ịka ụka ọnwụ ya ebe Archbishop nke Canterbury ga-ekwu okwu chukwu. E nwekwara ike ịkpọ Praịm Minista Liz Truss ga ọ gụọ otu ebe n'akwụkwọ nsọ.

Dịka akachara ụka ịkwa ya, a ga-akpụrụ igbe ozu Ezenwaanyị nọrọ n'ahịrị si ụlọụka ahụ gaa Wellington Arch dị na Hyde Park Corner tupu ịnyịnya adọkpụrụ ya gawa Windsor.
Igbe ozu Ezenwaanyị ga-eme njem ikpeazụ ya n'ehihie ahụ n'ụlọụka St George dị n'Obieze Windsor.
A na-atụ anya na Eze na ndị okenye n'ezinaụlọ Ezenwaanyị ga-esonye ngagharị ahịrị n'ogige dị n'etiti Obieze Windsor tupu igbe ozu ahụ abanye ime ụlọụka St George maka ekpere ili ya.

St George's bụ ụlọụka ndị ezinaụlọ Ezenwaanyị na-ahọpụtakarị maka agbamakwụkwọ, ụka nwa nakwa ili ozu.
Ọ bụ ebe ahụ ka Ọkparaeze Harry na nwunye ya Meghan lụrụ gbara akwụkwọ nakwa ebe a gara ụka akwamozu di Ezenwaanyị bụ Ọkparaeze Phillip.

A ga-eji akụrụngwa e ji ebu ozu ezinụlọ ndị Eze budaa akpatị ozu Ezenwaanyị tupu ọ wụba akụkụ ụka King George VI dị n'ime ụka St George's Chapel.











