Coronavirus: Lee ọtọrọ onye na onye ụdị coronavirus pụtagoro kemgbe 2020

Ndị ọrụ ahụike na-agba mbọ ịhụ na ọrịa Covid-19 belatara na mba ụwa

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị ọrụ ahụike na-agba mbọ ịhụ na ọrịa Covid-19 belatara na mba ụwa

Ọ na-agbagwoju ọtụtụ ndị mmadụ anya ụdị ọrịa covid-19 ole pụtarala kamgbe ya bụ ọrịa malitere ịkpa mkpamkpa.

Mata na nje niile nọ nọ n'ụwa nke gụnyere nje "SAR-CoV-2" bụ nje nke na ebute Covid-19 na-agbanwe onwe ha kwa mgbe kwa mgbe.

Ọtụtụ mgbe, mgbanwe ndị a anaghị egosi n'ahụ maọbụ n'udị ya bụ nje.

Ụfọdụ nwekwara ike igosi site na etu ha sị agbasa, ka o si emesi mmadụ ike n'ahụ, otu ọgwụmgbochi na ọ bụ ọgwụ ndị ọzọ si emetuta ya, akụrụngwa e ji elebe ya anya, nakwa ihe ndị ọzọ.

Otu ahụike mba ụwa bụ World Health Orgainisation (WHO) nakwa ndị ọrụ sayensị riri amosu n'ọrụ nchọcha malitere itinye anya na nnyocha gbasara ka nje SARS-CoV 2 si agbasa kemgbe Jenuwari 2020.

N'ihi etu ya bụ ọrịa si agbanwe, ndị ọkachamara kere ya ụzọ abụọ: "Variants of Interest (VOIs)" na "Variants of Concern (VOCs)" na bekee.

E mere nke a iji kwalite nnyocha na nlebanya n'ime ya bụ ọrịa.

Otu WHO nwere ngalaba na-enyocha akụkọ na ihe niile gbasara ụdị 'coronavirus' abụọ a, ma na-ezipụkwa ozi dị mkpa nye mba dị ịcheịhe banyere mpụtara nnyocha ha.

Mba dị ịcheịche nwekwara otu nnyocha nke ha na-adonyere otu nke WHO ukwu.

Nnyocha egosila n'ọtụtụ mba na usoro nchekwa ndị a WHO bipụtarala enyela aka na-igbochi mfesa nje coronavirus kemgbe ikpa ike ya malitere.

WHO nyekwara gọọmentị dị ịcheịche ikike na ndụmọdụ ihibe otu nchekwa n'aka ọrịa a nke ha ọkachasị ka o si emetụta ndị mba ha n'ụzọ pụrụiche.

Kedụ ka e si enyochapụta ma gụọ nje Covid-19 ọgbara ọhụrụ ọbụla aha?

WHO ehibela usoro ịgụ ọrịa nke usoro nọ n'okpuru ngalaba atọ bụ "GISAID", "Nextstrain" na "Pango".

Ndị a bụ ndị otu sayensị na ndị ọkachamara n'ihe gbasara nje.

Ha ihibela usoro ịgụ aha nje ọrịa a nke gụnyere: Aha dị mfe ịkpọpụta, aha na-agaghi ebute ịkpọ oke maọbụ nketọ nye ndị ọbụla nakwa ndị bu ọrịa a, aha ga-eso mkpụrụedemede mba Greece dịka "Alpha", "Beta", "Gamma", "Delta" wdgz.

Ndị ọrụ sayensị nọ n'ọrụ nhazigharị aha na itinye ụdịrị nje na-arụkọ na mba ụwa dịka WHO si hibe ha

Ebe foto si, SOPA IMAGES

Nkọwa foto, Ndị ọrụ sayensị nọ n'ọrụ nhazigharị aha na itinye ụdịrị nje na-arụkọ na mba ụwa dịka WHO si hibe ha

Udiri nje ọrịa Covid-19 ga agụrụla aha ugbua?

Kamgbe afọ 2020 enyochapụtara ọrịa Covid-19, otu e hibere maka nnyocha, ịgụ aha, nakwa nhazighari ụdịrị ọrịa a, epibụtala ụdịrị ise na mpakala nke "Variants of Concern (VOCs)".

Lee aha ha ebe a, mgbe achọpụtara ha nakwa ebe achọpụtara ha.

Aha ụdịrị ọrịa Covid-19 etinyerela na otu nke VOCs

Ebe foto si, WHO

Nkọwa foto, Aha ụdịrị ọrịa Covid-19 etinyerela na otu nke VOCs

*Mara na ozi maka nhazi ha nakwa ntinye n'otu VOCs maọbụ VOI e dere ebe a dị ire naanị mgbe e zipụtara ozi akụkọ a dịka e kwuru na a na-ahazịgharị ya kwa mgbe kwa mgbe (4, Febụwarị, 2022).

Marakwa ka e si ahazinye ụdịrụ nje ọrịa a na otu VOCs:

  • Ọ bụrụ na ụdịrị nje enyochapụtara ma-efefe nke ukwu maọbụ etu o si amụbawanye
  • Etu nje ọrịa Covid-19 enyochapụtara si akụda ahụike maọbụ ebute ọnwụ ndị mmadụ
  • Ọ bụrụ na ndị sayensị na ndị ọrụ ahụike a kana-achọ etu a ga e si balata mmụbawanye maọbụ mgbochi maọbụkwabụ ọgwụgwọ nje ọrịa a.

A bịa n'otu nje ọrịa nke VOIs.

Lee aha ha ebe a, mgbe achọpụtara ha nakwa ebe achọpụtara ha.

Aha ụdịrị ọrịa Covid-19 etinyerela na otu nke VOIs

Ebe foto si, WHO

Nkọwa foto, Aha ụdịrị ọrịa Covid-19 etinyerela na otu nke VOIs

*Mara na ozi maka nhazi ha nakwa ntinye n'otu VOCs maọbụ VOI e dere ebe a dị ire naanị ugbua mgbe e zipụtara ozi akụkọ a dịka e kwuru na a na-ahazịgharị ya kwa mgbe kwa mgbe (4, Febụwarị, 2022).

Marakwa ka e si ahazinye ụdịrụ nje ọrịa a na otu VOIs:

  • Ọ bụrụ na ihe ama banyere nje a ọhụrụ a nyiri ihe ama banyere ndị dapụtarala n'oge gara aga nke gụnyere: etu o si efe efe, etu e si enyochapụta ya nakwa ihe ndị ọzọ
  • Ọ bụrụ na ụdị nje a nwereike ife ọtụtụ ndị mmadụ na mba dị ịcheịche, makwa mụbawanye ruo oge ole m ole