Omicron: Gịnị mere Naịjiria ji soro na mba ndị Briten machiri?

Ndị na-abata ọdọụgbọelu Heathrow

Ebe foto si, Getty Images

Ihe mere mba Briten ji tinye usoro mgbochi nye ndị Naijịrịa na-eme njem ga mba ha ugbua.

Bido n'ụbọchị Mọnde, mba Brịten kwuru na ha amaala akara uhie n'elu mba Naijiria na ụfọdụ mba Afrịka ndị ọzọ banyere ime njem bata mba ha.

Nke bụ na mba ndị a bụ mba ndị a ga-akpachapụrụ anya ugbua dịka mba ndị ịcheịche na-akwalite nchekwa maka ọrịa COVID-19 agbara ọhụrụ na-efesasi mba ụwa n'ike akpọrọ 'Omicron'.

Onye nnọchịteanya mba Naijịrịa nye mba Brịten bụ Sarafa Tunji Isola akatọọla atụmatụ a kwuo na mmachị a bụ ihe ịkpọ ọke nye ndị isi ojii dịka akara uhie a metụtara naanị mba ndị Afrịka nke gụnyere South Africa, Namibia, Zimbabwe, Botswana, Lesotho, Eswatini, Angola, Mozambique, Malawi na Zambia.

Ka ọ dị ugbua, naanị ndị mba Brịten maọbụ Ireland bi na Naijịrịa nakwa mba ndị a akpụtara bụ ndị e nwere ike ikwe bata Brịten.

Onye ọbụla sị mba ndị a bata ga nọpụrụ onwe ya iche ruo abali iri n'ụlọ ezumike. Gịnị mere Brịten jịrị tinyere Naijịrịa na mba ndị ha kara akara uhie n'elu?

Gọọmentị mba Brịten kwuru na ha mere nke maka mpụtara nnyocha ha nke gụnyere:

  • Nnoycha ha gosiri na e nwereike inwe ọtụtụ ndị mmadụ bu ọrịa a na Naijịrịa ugbua
  • Ọtụtụ ndị enyochapụtarala ọrịa COVID agbara ọhụrụ a n'ahụ na mba Brịten si mba Naijịrịa bata
  • Ndị mba Naijịrịa na ndị mba Saụt Afrịka na emekọrịta nke ukwu, mara na Saụt Afrịka bụ ebe mba enyochapụtara nje 'Omicron'

Tupu etinye usoro mgbochi nye ndị njem na-aga mba ndị ọzọ maka ọrịa na-efe efe, a na-eme nnyocha mara ma ndị mba ahụ a na-agba ọgwụ mgbochi ka ha kwesiri.

Ka ọ dị ugbua ọtụtụ mba Afrịka anaghị agbazu ọgwụ mgbochi COVID nke mere mba Brịten ji tinye usoro mgbochi njem ibata mba ha ugbua ọkachasi nye mba ndị Afrịka.

Ka ọ dị ugbua, n'ụbọchị nke ise n'ọnwa Disemba, naanị ihe ruru 4.8 n'ime mmadụ 1000 bụ ihe gbazurula ọgwụ a.

A tụnyere mba Brịten, nke a anaghị aga nke ọma dịka mmadụ ihe ruru 178 n'ime 1000 gbazụrụla ọgwụ a ebe ahụ ugbua.

Mmadụ ole buterela ọrịa a na Naijịrịa ugbua?

Ọgwụ mgbochi na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria bụ Nigerian Centers for Disease Control (NCDC) ekwuola na naanị mmadụ atọ ka enyochapụtarala ọrịa a n'ahụ ha na Naijịrịa agbanyeghi na a na-atụ anya na ọnụọgụgụ a ga-ari elu gafee nke a ugbua.

NCDC kwukwara na ndị niile bu ọrịa a na Naijiria ugbua si mba Saụt Afrịka maọbụ metụrụ ndị si ebe ahụ aka.

Marakwa na ọnụọgụgụ pere ezigbo mpe ma a tụnyere ọnụọgụgụ mba Brịten ebe enyochapụtarala ọrịa a n'ahụ mmadụ nari atọ na iri atọ na isii (336).

Ka ọ dị ugbua, enyochapụta ọrịa a n'ahụ mmadụ ruru iri itoolu na ihe gafere otu izu na mba ụwa.

Agbanyeghi na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na Naijiria ugbua arighi elu ruo nke mba ndị Europe ndị ọzo, ụjọ ọtụtụ mba ndị ọzọ nye mba ndị Afrịka (nke gụnyere mba Naijịrịa) bụ na anaghị agba ọgwụ mgbochi ọrịa dịka etu ekwesiri.

N'izu ikpeazụ nke ọnwa Nọvemba ngụkọ gosiri na naanị mmadụ pasentị 0.07 n'ime mmadụ otu puku (1000) mere nnyocha ahụ maka ọrịa na Naijiria ebe mmadụ 14 pasentị n'ime otu puku mere nnyocha ahụ maka ọrịa na Brịten.