Omicron: Ihe ngalaba NCDC kwuru dịka nje Omicron batara Naijirịa

Ebe foto si, Reuters
Ngalaba Nigeria Centre for Disease Control bụ NCDC n'aha ịchafụ ekwuola na nje covid-19 ọhụrụ bụ Omicron abatala na Naijirịa.
Ya bụ nje nke ndị sayensi na-akpọ 'B.1.1.529 SARS-CoV-2 lineage' bụ n'ahụ mmadụ atọ sị mba Saụt Afrịka bata Naijirịa n'ịzuụka gara aga ka ha chọpụtara ya.
Ngalaba NCDC kwuru na ha ebidola usoro ịdopụ ndị a iche ma bido kwa ịchọta mmadụ niile ha na ndị a nwere mmekọ.
Ha mekwara ka ndị mmadụ ghọta na ndị niile na-eme njem ga-egosi na ha agbazuola ọgwụ mgbochi covid-19 maọbụ gosi mpụtara nyocha covid-19 nke na agafeghị ụbọchị abụọ.
NCDC gara n'ihu rịọ ndị Naijirịa ka ha rube isi na usoro nchekwa mfesa ọrịa covid-19 ma rịọkwa ka ndị mmadụ hara ịfesa akụko ụgha maka ya bụ ọrịa.
Ha kwuru na ọ bụ naanị NCDC maọbụ ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ahụike nwere ikike ịbupụta ozi ọbụla gbasara ya bụ nje.
Ihe dị mkpa ị kwesịrị ịma maka nje Omicron

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Sayensị achọpụtala ụdịrị coronavirus ọhụrụ na-ekpa ike nke ha na-ekwu na o nwereike ọgwụ mgbochi dị ugbua agaghị emenwu ihe ọbụla.
Otu 'World Health Organisation' gosikwara nchekasị ha n'ụdịrị coronavirus a ma baa ya aha dịka 'Omicron'.
E bu ụzọ chọpụta omicron na Botswana nakwa Saụt Afrịka n'ụbọchị 24 Nọvemba, 2021 mana ahụla ya na mba dịka Botswana, Belgium, Hong Kong, Isreal, Briten.
N'ihi nke a ọtụtụ mba gụnyere Briten, Amerịka, Suwizaland nakwa mba ndị dị na Yurope amachiela ụgbọelu si mba Saụt Afrịka, Lesotho, Botswana, Zimbabwe, Mozambique, Namibia, Eswatini ịbata obodo ha.
Ihe mere omicron jiri dị iche na coronavirus ndị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị ihe mbụ na nje nwereike ịgbanwe ụdịdị ya a kpọrọ 'mutation' na bekee mana ebe ọ na-enye nsogbu bụ o nwereike imetụta etu o si akpa ike n'ahụ mmadụ nakwa ime ka ọgwụ ghara ịrụ ọrụ n'ahụ onye ahụ.
A sị na nje coronavirus omicron nwere ọtụtụ mgbanwe, nyocha gosiri na o nwereike ịrịa onye rịara ya na mbụ ma gbakee.
WHO sị na ọ ga-ewe ha ụfọdụ izuụka ịchọpụtacha ka nje omicron si akpa ike nakwa etu o si amịbanye n'ahụ mmadụ.
Ha sị na nje omicron na-amụba n'ike n'ike na mpaghara Saụt Afrịka bụ ebe e bu ụzọ chọpụta ya.

Ebe foto si, Getty Images
Onye direktọ na-ahụ maka ibuagha megide Covid-19 na Saụt Afrịka bụ Tulio de Oliveira sị na etu omicron si akpa agwa dị iche na coronavirus ndị ọzọ.
Ọ sị na mgbanwe (mutations) nje a ruru iri ise nakwa ihe a kpọrọ 'spike protein' ya karịrị iri atọ.
Ọtụtụ ọgwụ mgbochi na-agbakwasị ụkwụ na 'spike protein' iri atọ bụ igodo ọtụtụ nje na-eji abanye n'ime ahụ mmadụ.
Omicron nwere ọtụtụ ndịiche n'ebe coronavirus si na Wuhan, Chaịna bụ ebe a gbakwasịrị ụkwụ rụọ ọtụtụ ọgwụ mgbochi.
Nke a pụtara na ọgwụ mgbochi ndị dị ugbua nwereike ha agaghị arụ ọrụ n'ahụ onye nwere nje omicron coronavirus.
A matachabeghi kpọmkwem ka nje omicron si akpa agwa, e nweela ụfọdụ ihe ngosi banyere ya mana nyocha ka na-aga n'ihu.
Etu Coronavirus si agbanwe ụdịdị

Dịka coronavirus na-efesasị ka ọ na-agbanwe ụdịdị ya, ka o banye n'ahụ ọtụtụ mmadụm, etu ahụ ka ọ ga-esi na-agbanwe ụdịdị ya.
Ọtụtụ mgbanwe ahụ na-ebuta ụdịrị coronavirus ọhụrụ a na-akpọ 'variant' na Bekee.
Mgbanwe ahụ na-enyere ya aka ịdịkwu ndụ ma nwee ike ịbanyenwu n'ime mkpụrụ ndụ mmadụ nke bụ 'human cells'








