Donald Trump: Goọmentị ọhụrụ a ga-eme ọfụma n'ihi na anyị tụrụ ha ezigbo ntọala

Trump

Ebe foto si, Reuters

Dịka Donald Trump na-akwapụ n'obi gọọmentị mba Amerịka, ọ gwara ndị na-akwado ya okwu ikpeazụ.

Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o kwuru -

  • Anyị rụharịrị ndị agha mba Amerịka ma wepụta ngalaba ndị agha ọhụrụ
  • Ndị agha lara ezumike nka nyere anyị votu 91% maka etu anyị siri leta ha anya nke ọma.
  • 'A ebu m n'obi na ha agaghị enye unu ụtụisi ọzo kama ha nye unu, cheta na m gwara unu agwa'
  • Anyị bulitere ohere ịnweta ọrụ nke ụkwu.
  • Gọọmentị ọhụrụ a hapu ihe etu o siri dị, ha ga-eme ọfụma; kama cheta kwa anyị mgbe ihe dịwara mma
  • Anyị wepụtara ogwu mgbochi n'ime ọnwa itolu na-agbanyeghị na ọ kwesiri ịwe ọtụtụ afọ
  • Anyị nwetara ntuliaka nde iri asaa na ise, enwebeghi onyeisiala nọ n'oche metụrụla ya mbụ.
  • Ị bụ onyeisiala Amerịka bu ugwu kachasị
  • A ga m alụru unu ọgụ, a ga m etinye anya n'ihe na-eme.
  • Goọmentị ọhụrụ a ga-eme ọfụma n'ihi na anyị tụrụ ha ezigbo ntụala
  • A na m ekele osote m bụ Mike Pence na nwunye ya na ndị obodo Washington DC
  • Ka ọ gaziere gọọmentị ọhụrụ a na-abanye n'ọchịchị.

Ufọdụ ihe ikpeazụ Donald Trump mere dịka ọ na-apụ n'ọchịchị

Trump eferela 'White House' aka ikpeazụ dịka onye chiburu Amerịka nke ugboro iri anọ na ise.

Ụgbọelu buru Trump na-aga na Joint Base Andrews ebe ọ ga-agwa ụwa okwu.

Dịka Donald Trump aghaarala Lil Wayne na ndị ọzọ ka ọ na-arịtu n'ọkwa ọchịchị taa

Onyeisiala mba Amerịka nwere ikike ịgbaghara ụfọdụ ndị kpara arụ dị iche iche megide iwu ha.

Trump tinyere ikike a n'ọrụ dịka ọ fọrọ awa ole na ole ka ọchịchị ya kụrụ ọnụ mgbe ọ gbaghaara mmadụ 143 gụnyere;

Steve Bannon - Ọ bụ onye ndụmọdụ Trump mgbe ọ zọrọ ọchịchị n'afọ 2016.

Steve Bannon

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, E buru Steve Bannon ebubo mpụ ego metụtara ịchụntaego mana ọ sị na aka ya dị ọcha.

A mara ya ikpe maka mpụ na nrụrụaka ego nke metụtara ịrụ mgbidi jikọtara Amerịka na Meziko.

Lil Wayne - Eziaha aha ya bụ Dwayne Carter, onye a ma ama na-eti egwu.

O kwuru eziokwu n'ebubo eboro ya maka ibu egbe mana Trump a gbagharala ya ugbua.

Ndị ọzọ bụ Kodak Black, Kwame Kilpatrick, Anthony Levandowski dgz.

Ihe ndị ọzọ Trump kwuru

Donald Trump on board Air Force One (file pic)

Ebe foto si, Reuters

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enyela okwu ikpeazụ ya dịka ọ na-apụ n'ọkwa ọchịchị.

Trump kwuru "Anyị mere ihe anyị bịara ime ma mee karịa."

N'ihe onyonyo o wepụtara na Youtube, o kwuru na ọ lụrụ "oke ọgụ siri ezigbo ike...maka na ọ bụ ihe unu ji họpụta m".

Onyeisiala mba Amerịka

Ebe foto si, Donald Trump

Trump kwuru "dịka onyeisiala mba Amerịka, e guzoro m n'ihu unu na-ekwu na obi juru m afọ n'ọrụ anyị rụrụ."

"Anyị ga-edu ọchịọchị ọhụrụ n'iyi ọrụ taa ma na-ekpe ekpere ka ọchịchị ya gaa nke ọma n'ichekwa Amerịka."

Trump kelere nwunye ya bụ Melania Trump, osote ya bụ Mike Pence na ndị ọrụ obiọchịchị 'White House' niile maka nkwado ha nyere ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Daddy Hezekiah: E meghi m ihe m meere Donald Trump maka "Visa"