Liverpool Vs Leeds United: Chi ndị Liverpool azọpụtala ha n'ọnụ agụ

Ebe foto si, Twitter/Liverpool
Chi ndị Liverpool zọpụtara ha n'ọnụ agụ dịka ha Leeds United gbachara egwu ndị ọ kara obi.
Leeds United ka si na Championship gbagote gosiri Liverpool na ha abịaghị ọgbọegwuregwu Anfield ịgụ oche ha ọnụ, dịka ha na ha mere 'nzọgbu nzọgbu' na be ha.
Goolu nọ na-awụbanye ka mmiri ozuzo ebe otu abụọ a nọ na-eme 'i mee m m megwara gị anaghị ese okwu', mana Liverpool mechara merie na ngwụcha ya bụ egwu.
Mohamed Salah nke Liverpool nyere goolu atọ na nkeji anọ, nkeji 33 na nkeji 88, nke abụọ n'ime ha bụ penariti; ebe Virgil Van Dijk nyere nke ya na nkeji 20.
N'otu aka ahụ, Leeds si n'azụ bịa saa goolu atọ n'ime ya tupu Salah emewaa ha obi.
Goolu atọ ahụ si n'ụkwụ Jack Harrison na nkeji 18, Patrick Bamford na nkeji 30 nakwa Mateusz Klich mezuru ya atọ na nkeji 66.
Arsenal agwọọla Fulham ka ji mpataka dịka afọ ọhụrụ na-ebido

Ebe foto si, Twitter/Arsenal
Arsenal ji ọkpụ goolu atọ asataghị ihe ọbụla fachie Fulham ọnụ na be ha, dịka afọ ọhụrụ Premier League malitere.
Arsenal abịaghị igwu egwu, n'agbanyeghi na Fulham nabatara ha dịka ọbịa na be ha.
Willian gbara bọọlụ mbụ dịka onye Arsenal ka o si Chelsea gafete, ghọrọ agụ dịka ọ bụ ya dọnyere nri n'efere e ji gbakanyechaa goolu atọ ahụ Arsenal nyere.
Alexandre Lacazette nyere goolu mbụ na nkeji asatọ e ji bido bọọlụ.
Gabriel dos Santos Magalhães mezuru ya abụọ na nkeji 49, tupu Pierre-Emerick Aubameyang emezuo ya atọ na nkeji 57.
Goolu Aubameyang nyere n'egwuregwu a mere ya nke 57 ọ na-enye na Premier League kemgbe afọ 2018 ọ malitere ịgbara Arsenal bọọlụ.
Nke a bụ egwuregwu nke mbụ a na-agba na Premier League n'afọ ọhụrụ a.










