AFCON Group D: South Africa aghọọla Erọn gbara aka laa

Ebe foto si, CAF/Twitter
Mba Saut Afrịka enwetaghị onwe ha mgbe ha zutere Ivory Coast na asọmpi bọọlụ mba Afrịka 'AFCON 2019' taa.
Ivory Coast ji otu ọkpụ goolu asataghị asata wee gwa Saut Afrịka na nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ.
Jonathan Kodija nyere goolu ahụ na nkeji 65 wee mewaa ndi Saut Afrịka obi.
Nke a pụtara na Ivory Coast na Moroko nwere akara atọ akara atọ na "Group D" dịka Moroko ji otu ọkpụ goolu merie mba Namibia ụnyaahụ.

Ebe foto si, CAF/Twitter
Saut Afrịka ga-agbazi mbọ imeri asọmpi nke ha na ndị Namibia ụbọchị Fraidee abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun 209.
Na asọmpi nke ọzọ agbara taa, mba Angola na Tunishia nyere onwe ha otu goolu otu goolu ebe Mali na Mauritania ga-ezute onwe ha n'elekere itoolu nke abali.
Akụkọ ga-amasị gị:







