AFCON fixtures: Ọnyụpa Guinea na Madagascar gbara bụ uru Naijiria

Ebe foto si, CAF/Twitter
Ala adịghị mma bu uru ndị nze.
Otu ahụ ka ọnyụpa Guinea na Madagascar gbara n'asọmpi AFCON ụbọchị Satọdee siri bụrụ uru Naijiria.
Ugbua, otu egwu Super Eagles bụzị ndị mbụ na 'Group B' dịka ha ji otu ọkpụ goolu asataghị asata gbaa aka ahia mgbe ha zutere mba Burundi.

Guinea na Madagascar nyere onwe ha goolu abụọ abụọ na asọmpi ha nke pụtara na ha abụọ nwere naani otu akara otu akara ebe Naijiria nwere akara atọ.
Ka ọ dị ugbua, ndị egwu bọọlu Naijiria ga-agafe n'agba nke abụọ ma ha merie Guinea ụbọchị Wenesdee, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Juun.
Nkea bu nke mbu mba Madagascar nakawa Burundi na-esonye na asọmpi iko mba Afrịka bụ AFCON, mana ha egosila ụwa na elelịa nwa ite, onwekwara ike gbọnyụọ ọkụ.
Akụkọ ga-amasị gị:







