You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
AWCON 2018: Falcons anyụọ Bayana ịkpakwụ
Mmeri Super Falcons meriri otu Bayana Bayana nke South Africa emeela ka ha bute iko nke itolu (9) n'asompi AWCON.
Ka nkeji 90 agbazuru bọọlụ, enyekwara ha nkeji iri na atọ ọzọ mana onweghị onye nyere goolu.
Nke a mere ha jiri gbaa penariti bụ nke ndị Super Falcons ji gbajie ha aka napụ ha ya bụ iko ka ha nyere goolu anọ ebe South Africa nyere atọ.
Nke a bụ ugboro 11 agbagoro egwuruegwu a. Naịjirịa jide itoolu ya ebe Equatorial Guinea ji abụọ ndị ọzọ.
South Africa azọọla iko a na-agba nke ikpeazụ ugboro anọ na-achitaghị aja. N'ime ugboro anọ ahụ, ha na Naịjirịa agbaala ugboro abụọ bụ nke Naịjirịa merichara ha.
Abịa n'otu ụmụnwaanyị gbara asọmpi nke 2018 a, ihe karịrị ọkara n'ime ha na-agba bọọlụ na mba ofesi, ebe ndị ọzọ na-agba bọọlụ na Naịjirịa.
N'ime otu a sokwa gaa, a kpọrọ aha mmadụ anọ n'ime mmadụ 15 nwere ike inweta ihe nrite "Nwaanyị kacha agba n'Afrịka" nke 2018.
Onye nchịkọta otu Falcons bụ Thomas Dennerby, sokwa na mmadụ ise nwere ike inweta ihe nrite "Onye nkuzi kacha akuzi" nke 2018.
Ndị egwu
Ndị oche goolu
1) Tochukwu Oluehi
Oluehi na-eyi uwe e dere 1, na-eche goolu na Rivers Angels dị na Rivas steeti na Naịjirịa.
A mụrụ ya n'afọ 1987.
2) Christy Udogadi Ohiaeriaku
Ohiaeriaku na-echere ndị Confluence Queens dị na Kogi steeti goolu.
A mụrụ ya n'afọ 1996.
3) Chiamaka Cynthia Nnadozie
Nnadozie na-echere ndị River Angels bọọlụ.
A mụrụ ya n'afọ 2000.
Ndị na-agba n'azụ
4) Onome Ebi
Ebi na-eyi uwe e biri ise n'elu, na-agba bọọlụ na Henan Huishang dị na mba China.
A mụrụ ya n'afọ 1983.
5) Osinachi Marvis Ohale
Ohale na-eyi uwe e biri atọ n'elu, na-agba bọọlụ na Vaxjo DFF dị na mba Swidin.
A mụrụ ya n'afọ 1991.
6) Glory Ogbonna
Ogbonna na-agba bọọlụ na Ibom Angels dị n'Akwa Ibom steeti.
A mụrụ ya n'afọ 1998.
7) Josephine Chukwunonye
Chukwunonye na-agba bọọlụ na Asarums IF dị na mba Swidin.
A mụrụ ya n'afọ 1992.
8) Ngozi Ebere
Ebere na-agba bọọlụ na Barcelona FC dị na mba Spen.
A mụrụ ya n'afọ 1991.
9) Faith Ikidi Michael
Ikidi na-agba bọọlụ na Piteå IF dị na mba Swidin.
A mụrụ ya n'afọ 1987.
10) Sarah Nnodim
Nnodim na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti.
A mụrụ ya n'afọ 1995.
Ndị egwu etiti
11) Ngozi Okobi
Okobi na-agba bọọlụ na Eskilstuna United dị na mba Swidin.
A mụrụ ya n'afọ 1993.
12) Anam Imo
Imo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa steeti.
A mụrụ ya n'afọ 2000.
13) Halimatu Ayinde
Ayinde na-agba bọọlụ na Asarum IF dị na mba Swidin.
A mụrụ ya n'afọ 1995.
14) Rita Chikwelu
Chikwelu na-agba bọọlụ na Kristianstand DFF dị na mba Swidin.
A mụrụ ya n'afọ 1988.
15) Amarachi Okoronkwo
Okoronkwo na-agba bọọlụ na Nasarawa Amazons dị na Nasarawa.
A mụrụ ya n'afọ 1992.
Ndị na-agba n'ihu
16) Asisat Oshoala
Oshoala nwetara ihe nrite "nwaanyị kacha agba n'Afrịka" nke afọ 2017, ma bụrụkwa onye kacha gbakpuo bọọlụ na neetị n'Iko Mba Afrịka nke 2016.
Ọ na-agba bọolụ na Dalian Quanjain FC dị na mba China.
A mụrụ ya n'afọ 1994.
17) Desire Ugochi Oparanozie
Oparanozie malitere ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2010. O nwetara ihe nrite boot ọlaedo a na-enye onye kachasị nye goolu nke asọmpi AWCON e mere n'afọ 2014.
Ọ na-agbara otu Guinamp dị na mba Frans bọọlụ.
A mụrụ ya n'afọ 1993.
18) Francisca Ordega
Ordega na-eyi uwe 17, na-agba bọọlụ na Washington Spirit dị na mba Amerịka, mana ezigara ya Atletico Madrid na mbinye.
Ọ nọchitela anya Naịjirịa n'asọmpi ndị na-agafeghị afọ 17 nakwa nke ndị na-agafeghị afọ 20.
O so Naịjirịa bulie iko atọ n'afọ 2010, 2014, 2016.
A mụrụ ya n'afọ 1993.
19) Rasheedat Ajibade
Ajibade na-agbara FC Robo dị na Legọs steeti bọọlụ.
O nwetara ihe nrite "onye kachasị gbaa ọfụma" n'egwuregwu Naịjirịa na Kanada oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016.
A mụrụ ya n'afọ 1999.
20) Chinwendu Vera Ihezuo
Ihezuo na-agbara BIIK Kazygurt dị na mba Kazastan bọolụ.
O nwetara ihe nrite "onye kachasị gbaa ọfụma" n'egwuregwu Naịjirịa na Spen oge ha zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2016.
A mụrụ ya n'afọ 1997.
21) Chinaza Uchendu
Uchendu na-agbara ndị Sporting club de Braga dị na mba Pọtugal bọolụ.
A mụrụ ya n'afọ 1997.
Onye nchịkọta
Thomas Dennerby malitere ịchịkọta otu Super Falcons n'ọnwa Jenụwarị nke 2018.
Ọ bụbu onye nchịkọta otu egwu ụmụnwaanyị mba Swidin.