You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Super Falcons kpọchuru ajọọ ihu ụnyahụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa.
'Social media' nwuru ọkụ maka Aisha Wakil
Kamgbe Aisha Wakil kọwachara BBC Igbo n'asụsụ Igbo ka ya ndị oyi egwu a sị akpa,ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu uche ha na igwe okwu 'social media'. pia ebe a kị ihụ ya.
France 8 Super Falcons 0
Ụmụnwaanyị egwu bọlụ nke Naịjirịa bụ Super Falcons na nke ndị France sọrọmpi enyi na enyi ụnyahụ bụ Fraide.
Ya bụ mpi ha sọrọ kpọrọ ndị super Falcons ihụ ọjọọ site na ịgba ha ọkpụ asatọ chara acha na ọgbọ egwuruegwu MMArena na Le Mans, France.
Gọvanọ Ọbialọ kwuputara mkpa ọdị ịkwado agaumakwụkwọ
Gọvanọ Willie Obialo nke Anambra Steeti ekwupụtala mkpa ọdị ịkwalite agụm akwụkwọ na steeti ahụ.
Okwuru nke a ụnyahụ mgbe ọ gara emụme nkwado agụm akwụkwọ nke ndị Onyebuchi Chris Ifediora Foundation kpokobara na Aguleri.
Onye nọchite anya ya na ya bụ emume bụ Joy Ulasi kwuru ọdịghị mma ị hapụrụ nanị gọọmenti ọrụ gbasara agụm akwụkwọ.
Ndị uweojii London akasiela ndị mmadụ obi na London
Na mba ofesi, ozị sị London erụ anyị ntị sị na-ezipula ndị ụweojii narị atọ na ọgbe ndị omekaome kacha akpa ike.
Egburu mmadụ 6 ma merukwa ụfọdụ ahụ na mpaghara London ụfọdụ n'izụụka gara aga.
EU ekwetala ịkwado agha a na ebuso mpụ ọzọ
Ndị otu European union a ekwuputela mkpebi ha ịkwado agha a na-alụ megide ndị omekataraihepuujọ na Naịjirịa.
Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ United Nations na-ahu maka ọgwụ na mpụ bụ Sylvester Atere
kwuru na nkwado nke a ga erụ afọ 3.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji
Ihe nkiri taa