World Cup 2018: Ajentina ejirila 2 - 1 gbapụ Naịjirịa

Ebe foto si, Pius Utomi Ekpei
Naịjiria na Aịsland adapụla ka Ajentina meriri ha ma gafee agba mgbapụ.
Daalụ maka isonye anyị n'abalị a, sonyekwa anyị ọzọ echi.
Mmeri ajentina meriri Naịjirịa pụtara na ha ga-ezute Frans n'agba mgbapụ (round of 16).
Cheta na nke a mere ya ugboro ise Naịjirịa na Ajentina na-ezute n'egwuregwu bọọlụ.
Nkeji 90 na ụma: Ogbu bọọlụ enyela Messi akwụkwọ edo edo.
Nkeji 90 na ụma: Naịjirịa ewepụla Musa tinye Simy Nwankwo.
Nkeji 90 na ụma: Ogbu bọọlụ enyela Mikel Obi akwụkwọ edo edo.
Nkeji 90: Naịjirịa ewepụla Omeruo tinye Iwobi.
Nkeji 87: GOOOLUUUU!!! Rojo agbakaala neetị ka Mercado bunyere ya bọọlụ.
Nkeji 83: Ighalo butere bọọlụ mana Armani tinyere ahụ ya, bọọlụ ebie ya n'ahụ.
Nkeji 81: Rojo agbaala bọọlụ n'ihu poostu Naịjirịa mana Higuain butere ya gbafuru ya.
Nkeji 80: Ajentina ewepụla Tagliafico tinye Aguero.
Nkeji 78: Aịsland asaala goolu ndị Kroeshia nyere ha, nke pụtara na enwebeghị onye isi ya pụtara n'etiti Naịjirịa, Aịsland na Ajentina ugbua.
Nkeji 76: Ndị Naịjirịa etiela mkpu maka penariti. Ogbu bọọlụ gara lee VAR, mana o kweghị enye ha penariti.
Nkeji 72: Ajentina ewepụla Di Maria tinye Meza.
Nkeji 70: SHỌỌTỤ!!! Ndidi gbara shọọtụ dị egwu mana bọọlụ gafere n'elu neetị Ajentina.
Nkeji 67: Mascherano emerụọla ahụ n'ihu, mana ọ chọghị ịpụ ga hichapụ ọbara na-apụta.
Nkeji 64: Ogbu bọọlụ enyela Banega akwụkwọ edo edo.
Nkeji 62: Ajentina nwetara 'corner kick' ka Ekong gbapụrụ nso neetị, mana ha ejinwughị ya nye goolu.
Nkeji 61: Ajentina ewepụla Perez tinye Pavon.
Nkeji 59: Musa ebutela bọọlụ, gbada n'aka ekpe, kpapụ Mascherano n'ụzọ mana bọolụ o bunyere Ighalo abanyeghị.
Nkeji 55: Ndị na-akwado Ajentina etishiela mkpụ ike maka goolu Naịjirịa nyere. Ha ma na nkwado ha ga-enyere ndị ọgba bọọlụ ha aka ma ọ bụrụ na ha ga-emeri taa.
Nkeji 50: GOOOOOLLLLUUU! Moses enyela penariti ya.
Nkeji 49: Ogbu bọọlụ enyela Naịjirịa penariti ka o lechara VAR. Mascherano nwetara akwụkwọ edo edo maka ihe o mere Balogun.
Nkeji 47: Naịjirịa ewepụla Iheanacho tinye Ighalo.
Nkeji 45: E bidola ọkara nke abụọ.
Goolu Messi nyere na nkeji 14 mere ya nke mbụ ọ na-enye kamgbe e bidoro asọmpi a.
Ndị Ajentina chara Naịjirịa ezigbo ọkụ n'ime ọkara nke mbụ nke egwuregwu a, nke mere na obi amapụla ndị na-akwado Naịjirịa maka amaghị ma isi Naịjirịa a ga-apụtakwa taa.
Cheta na ọbụrụ na Naịjirịa na Ajentina gbaa onye laba onye laba, ndị Ajentina ga-apụ n'asọmpi a. N'otu aka ahụ, ọbụrụ na Aịsland merie Kroeshia n'egwuregwu nke ha, Ajentina ga-alatụkwa.
Mana ọbụrụ na Ajentina merie Naịjirịa, ha ga-agafe agba mgbapụ, ga-eme ka Naịjirịa pụọ n'asọmpi a.
Ndị nọ n'oche Ajentina: Nahuel Guzman, Willy Caballero, Giovani Lo Celso, Maximiliano Meza, Paulo Dybala, Lucas Biglia, Eduardo Salvio, Cristian Pavon, Federico Fazio, Marcos Acuna, Sergio Aguero, Cristian Ansaldi.
Ndị nọ n'oche Naịjirịa: Ikechukwu Ezenwa, Daniel Akpeyi, Alex Iwobi, Simy, Odion Ighalo, Tyronne Ebuehi, Abdullahi Shehu, Chidozie Awaziem, John Ogu, Elderson Echiejile, Joel Obi, Ogenyi Onazi.
Ndị Ajentina ji bido bọọlụ: Franco Armani; Gabriel Mercado, Nicolas Otamendi, Marcos Rojo, Nicolas Tagliafico; Javier Mascherano, Ever Banega; Enzo Perez, Lionel Messi, Angel Di Maria; Gonzalo Higuain.
Ndị Naịjirịa ji bido bọọlụ: Francis Uzoho; Leon Balogun, Kenneth Omeruo, William Troost-Ekong; Victor Moses, Wilfred Ndidi, John Obi Mikel, Oghenekaro Etebo, Brian Idowu; Kelechi Iheanacho, Ahmed Musa.













