Real Madrid na Bayern ga-achịpụ ya taa

Ebe foto si, Getty Images
N'abalị a mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ (7:45 pm) ka ndị Bayern Munich nke Spen na ndị Real Madrid nke Jamani ga-ama ọkaibe na ọgbọ egwuruegwu nke Allianz Arena.
Ndị otu egwuruegwu abuo a abu asụ anwuru n'asọmpi.
Ya mere ndị na-so ya ji esi ọnwụ na ọ ba ndị nke ha ga emeri.
Mana cheta na onye ndụ ndị Bayern Munich bụ David Alaba e soghị sọọ mpi nke eji akwado bọlụ nke emere ụnyahụ maka ahụ omeruru na apata.

Ebe foto si, Getty Images
Onye nkuzi ha bụ Jupp Heynckes si na ọ bụ tata ka a ga-amata ma Alaba a ga-so mgbaa tata.
A na-atụanya na Rafinha nke sị mba Brazil nwere ike ịnọchị anya Alaba ma ọ bụrụ na ọ gbaghị.
A na-elekwa anya na James Rodriguez nwere ike ibido asọmpi ahụ.
Gee ntị ka ị nụ onu ndị n'so Bayern.
Zinedine Zidane bụ onye nkuzi ndị Madrid sị na ha nwere olile anya na-agbanyeghị na ha enwetachaghị golu niile ha kwesiri ịnye na asọmpi ndị gara aga.
Dịka osiri kwuo, "n'egwuruegwu bọlụ, ihe ọ bụla nwere ike ime".
Ọ sịrị na ya agaghị akarụ ụbọchị ma chị ejighi.
Gee onye nkwado ha ntị n'olu.
Akụkọ ga-amasị gị:










