Real Madrid agbapụla PSG na Champions League nke 2018

Real Madrid bụ ndị buliri iko Champions League n'afọ garaaga (2016/2017) abanyela n'agba nke anọ ka ha merichara Paris St-Germain (PSG) na be ha.

Onye egwu ha bụ Cristiano Ronaldo nyere goolu atọ n'ime egwuregwu abụọ ha gbara nke mere ka ha ji nchịkọta 5-2 merie.

Onye egwu ndị PSG bụ Neymar agbaghị bọọlụ maka ahụ ọ merụrụ, nke so mee ka ndị otu ya 'chọọ ya achọọ' maka ọdịrị egwu ọ na-eke na goolu ọ na-enyere ha.

Achụpụrụ onye egwu etiti ndị PSG bụ Marco Verratti ka egwuregwu ha na-eweta aka na nkeji 66, mere ndị otu ya ji fọrọ nanị mmadụ iri n'ọgbọ egwuregwu.

Ka ọ gbaliri Casemiro elu, enyere ya akwụkwọ edoedo, ma nye ya ọzọ ka ọ chụrụla ogbuopi gawa nke kpatara o ji nweta nke abụọ ọ ga-enweta n'ime egwuregwu ahụ, nke chịkọtara ọnụ pụta otu akwụkwọ ọbaraọbara.

Edison Cavani nyerela PSG otu goolu ebe Casemiro nyerela Real Madrid goolu ha nke abụọ.

Nke a ga-eme ya afọ abụọ n'usoro PSG bụ ndị nọ n'elu tebulu na Ligue 1 na-apụ n'ime agba nke 16 nke asọmpi a.

Oge ikpeazụ PSG ruru agba nke abụọ n'asọmpi a bụ n'afọ 1994/1995, ha enwegeghị ohere ịgafe agba nke anọ kamgbe ahụ.

N'aka ọzọ, nke a bụ afọ asatọ n'usoro Real Madrid na-abanye n'agba nke anọ, ebe ha ga-agba mbọ ịhụ ma ha a ga-ebulinwu iko Champions League nke atọ n'usoro.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: