You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup: Ọ fọrọ ụbọchị 100 tupu asọmpi ebido
Taa ga-eme ya mbido ọnụọgụgụ ụbọchị 100 tupu asọmpi iko mbaụwa ebido na mba Rọshịa.
Ndị mba Rọshịa egosila nkwado ha site n'itinye nnukwu elekere na-egosi ka ụbọchị na oge na-aga n'ihu Red Square na Kremlin dị n'etiti Moscow.
A ga-agba asọmpi a site n'ụbọchị 14 n'ọnwa Juun ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị 2018.
Obi ọ dị gị ụtọ?
Ọ kwesịrị ịdị gị maka na ọ bụ nanị ụbọchị 100 fọrọ tupu o bido.
Cheta na Naịjirịa, Kroeshia, Ajentina na Aịsland nọ n'ime ofu otu.
Naịjirịa na Kroeshia ga-ebu ụzọ sọọ mpi n'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun.
Ha na Aịsland ga-asọmpi n'ụbọchị 22 nke ọnwa Juun.
Ebe ha na Ajentina ga-ezukọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Juun.