You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụkwụ Neymar rọjiri akụpụla ya n'asọmpi na-abịa
Neymar da Silva Santos bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Paris St-Germain agaghị eso n'asọmụnpị Paris St-Germain na Real Madrid n'iko Champions League maka omerụrụ ahụ n'ụkwụ.
Neymar dị afọ iri abụọ na isii merụrụ ahu n'ogweụkwụ n'ụbọchị ụka n'asọmpị Paris St-Germain na Marseille.
Ndị dokinta ekwubeghị oge Neymar ga-agbake.
Neymar ba otu PSG n'ọnwa August n'afọ 2017, o nyere goolu ruru iri abụọ na itoolu n'ime asọmpị iri atọ.
Ugbua PSG ji akara iri anọ karị Monaco.