You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Joe Achuzia, onye agha Biafra anwụọla
Onye bụ otu onye ndị duru ndị agha Biafra n'agha Naịjiria anwụọla ka ọ gbara afọ ịrị itoolụ.
Joe Hannibal O.G. Achuzia nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị taa ebe elekere asatọ n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti n'Asaba.
Diọkpara ya bụ Onyeka Achuzia gwara ndị ntaakụkọ n'Asaba na ọ bụ obi tiwara etiwa ka ha jiri agbasa ozi a.
"Nnam rịara ọrịa nwa ntakịrị oge tupu ọ nwuọ. Ihe a dị anyi nwute."
Achụzia so na ndị ịsị agha Biafra nụrụ ọgụ mnwere onwe n'afọ 1967.