You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Oji otu ụkwụ agba egwu
Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjira nwere ọrụsị na-eju n’okporoụzọ na-arịọ arịrịọ, mana Doris ekwenyeghi na nke a.
Ọ gwara BBC Igbo na ya agaghị esonye na ndi na-arịọ arịrịọ maka na Chukwu goziri ya.
Doris kọwara na ọ bụ ọgba tum tum kụrụ ya oge ọ bụ nwata ma gbajie ya ụkwụ nke mere na ndị dibia Bekee kwuru ka e bee ya ụkwụ.
O kwuru na ọ gbawara ya obi mana ya chọpụtara na ya bụ onye a goziri agozi maka na o nwere ndị enweghi ụkwụ maọbụ aka, mana ya nwere otu ụkwụ na aka abụọ.
Doris si na olileanya ya bụ ịbụ onye a ma ama n’ihe nkiri site n’ime ihe onyonyo nakwa na ịgba egwu nke ụkwụ ya anaghịakwụsị ya ime.
O mela ihe onyonyo ruru mkpụrụ anọ ebe ọ na-esonyekwa na ihe onyonyo egwu.