You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
N'ikpazu NFF echetala Okocha, Kanu na ndị ọzọ gbara Naịjirịa bọọlụ
Ndị na ahu maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bu NFF tụnyere ndị mmadụ ugo ụnyaahụ na emume ha kpọrọ 'NFF Awards'.
Victor Moses nwetere ihe nrite dịka ọkacha agba na bọọlu nke ụmụnwoke, ebe Asisat Oshoala nwetere nke ụmụnwaanyị.
Ndị NFF gakwara n'ihu kwanyere ndị gbara mbọ na ihe banyere egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa. Ndị dịka Austin Equavoen, Christian Chukwu, Austin Okocha, Mercy Akide na ndị ọzọ nwetera nrite eji cheta ha na emume a.
Ndị ọzọ nwetere ihe nrite bụ:
Kenedy Boboye enyere 'Coach of the Year' nke ụmụnwoke
Ann Chiejine nwetere 'Coach of the Year' nke ụmụnwaanyị
Ikoumen Udo enyere 'Young Player of the Year' nke ụmụnwoke
Rasheedat Ajibade ritere 'Young Player of the Year' nke ụmụnwaanyị