You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Udọ jịkọrọ Oliseh na Fortuna Sittard adọbiela
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Sunday Oliseh bụ onye nkuzi otu bọọlụ Fortuna Sittard n'ala Nertherlands kwuru ụnyaahụ na ọ kwụsiri ọrụ n'otu bọọlụ ahụ.
Ọ sịrị na ihe e jirir chụọ ya n'ọrụ bụ na o kweghị ime ịhe megidere iwu n'otu ahu.
Fortuna Sittard kwukwara na Oliseh bụ onye n'enye mmadụ niile nsogbu n'orụ ya, na ọ bụ n'ihi nke a ka ha jịrị chụọ ya.
Ha nyere Claudio Braga bụ onyenkuzi otu nke ụmụaka ka onye ga-anọchịte anya tupu achọta onye ọzọ.
Cheta na n'ọnwa Jenụwari, Fortuna Sittard gọrọ agụgọ na ha achụghị Oliseh n'ọrụ.
Lee ihe Oliseh dere n'elu igweokwu Twita:
Fortuna Sittard kwuru nke ha kwa n'elu ya bụ igwe okwu Twitter: