You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Iwobi Nwafọ Naịjirịa abụrụla sinetọ mbụ na mba Itali
Toni Iwobi bụ onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara igwe technụzụ abụrụ sinetọ mbụ nItali bụ onyeisi ojii.
A họpụtara ya na ntuliaka e mere na obodo Breshia dị na mpaghara ugwu mba Itali.
N'okwu ya, "Ndị ọyị m, eji m ọṅụ agwa unu na ahọpụtala m dịka sinetọ na Ripọblik!
"Ọ karịala afọ iri abụọ na ise anyị na-alụ ọgụ a chọrọ ibido ihu ọhụrụ!"
O kelere ndị kwadoro ya inweta ọkwa ahụ.
Iwobi bụ onye otu pati Anti-Migrant League bụrụ onyendu akụkụ obodo ya n'afọ 1995.
Iwobi dị afọ 62 gara mba Itali ihe ruru afọ 40 gara aga dịka nwaakwụkwọ. Ọ lụrụ onye mba ahụ ma bido ụlọọrụ na-ahụ maka igwe mgbasaozi technụzụ.