You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Davide Astori onyendu Fiorentina anwụọla n'afọ 31
Onyendu otu egwururegwu bọọlụ Fiorentina n'akwa Italy bụ Davide Astori anwụọla n'afọ 31.
Astori na-agba ka onye nchekwa nwụrụ ka arụ rịara ya, ndị Fiorentina kwuru na Twitter.
Fiorentina kwesiri ịgbasị ndị Udinese bọọlụ na 'Serie A' taa mana akagbuola asọmpị ahụ.
Astori gbaara ndị Italy bọọlụ ugboro 14. Ọ si Cagliari gawa Fiorentina n'afọ 2016 ebe ọ gbaara ha bọọlụ ugboro 58.
N'otu aka ahụ, Cagliari na onwe ha kagburu asọmpi ha na Genoa kwesiri ịgba taa .
"Fiorentina na ada ezigbote iriuju maka ọnwụ onyendu anyị bụ Davide Astori," Fiorentina kwuru.
"Maka ọdachị a na etu o siri di, anyị na arịọ ka mmadụ niile kwanyere ndị nwe ya ugwu."
Astori bidoro njem bọọlụ ya na ụlọ mmụta nke ụmụaka n'AC Milan tupu ọ gawa Cagliari na 2008.
Ọ nọ afọ asaatọ na Cagliari, bụ ebe ọ sikwa ga gbaara ndị ọzọ bọọlụ n'ụdị ndị Bekee na-akpọ 'loan'.