PSG a ga-akpanwu ike ka Neymar anọghị n'asọmpi ha na Madrid?

Mmerụ ahụ onye egwu ndị Paris Saint Germain (PSG) bụ Neymar merụrụ o nwere ike ime ka-agbapụ ha n'asọmpi Champions League ha na Real Madrid ga-agba taa?

Mmekpa ahụ na-eche PSG ka ha na Real Madrid ga-asọmpi 'onye ike ga-agwụ' iji mara ma ha a ga-enweta mmeri iji gaa n'ihu na Champions League.

Real Madrid gbara ha 3-1 n'asọmpi nke mbụ, n'agbanyeghị na Neymar so gbaa egwuregwu ahụ.

Kama, ihe agbanweela maka na ahụ ọ merụrụ ka ha na Marseille sọrọ mpi nwere ike ime ka ndị otu ya taa ahụhụ ma ọ bụrụ na Madrid chịrị ọkụ bịa.

Onye egwu PSG ọzọ bụ Angel di Maria ga-eduputa ndị otu ya ma ha na Real Madrid bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ zute taa.

Di Maria enyela goolu asaa n'ime egwuregwu isii ikpeazụ ọgbarala.

Mana obi kara onye ncheazụ ha bụ Dani Alves na ha ga-emeri.

O kwuru sị "anyị nwere ike ịnọ ala bee akwa, maọbụ anyị ebilie ọtọ mee ihe anyị nwere ike ime."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: