'Ndị gọọmentị na ndị ụwa agbahapụla Chibok'

Ebe foto si, Gift Ufuoma
- Onye dere ya, Azeezat Olaoluwo
- Ndị mere akụkọ a, BBC reporter
- Ebeg o si, Chibok, Nigeria
N'April 2014, obodo Chibok dị n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Naijiria ka akpu na ọnụ na mba ụwa mgbe a tọọrọ ụmụ agbọghọ 276 na be ha, nke mere e jị bịdọ mgbasa ozi #bringbackourgirls na ụwa niile.
Afọ iri ka e mesịrị, ihe iyi egwu na-aga n'ihu na obodo ahu, òtù ndị na-eme ihe ike na ndị ntọrị ka na-enye ndụ ọtụtụ ndị obodo ahụ nsogbu.
Na anya mmiri, Esther Yakubu na-echeta otú ndụ sirila sieele ya ike kengbe atọorọ nwa ya nwanyị bụ Dorcas.
"Afọ iri eruola kengbe nwa m nwaanyị nọ na aka ndị Boko Haram. Ịhe a dịtụbeghị mfe. Ndị mmadụ ga-asị na m kwesịrị ịga n'ihu chefuo maka nwa m nwanyị maka na m nwere ụmụaka ndị ọzọ, ma na mgbe ọbụla naanị m nọ, m na-eche echịche banyere ya.''
Ịhụ ihe ụfọdụ bụ nke Dọkas n'ụlọ na-ebutere ya ọbị ngbawa mgbe nile, ọ dịghịkwa ekwe ya ka ọ pụọ n'iru uju. Esther kpebiri ikpochapụ ịhe ụfọdụ, ewezuga foto ole na ole.
''Enyere m ndị bi na mpụga Chibok ihe ya niile ka ọ ghara idi m nso. Achọghị m ịhụ ha.''
N'abalị 14 Eprel 2014, ndị otu Islamist Boko Haram tọọrọ ụmụntakịrị nwanyị ọnụ ọgụgụ ha dị 276 n'ụlọ akwụkwọ obibi na Chibok, obodo amachaghị ama mgbe ahụ.
Ntọọrọ a kpalitere mgbasa ozi nke zuru ụwa ọnụ akpọrọ #BringBackOurGirls, nke otutu kwadoro dịka nwunye mbụ US na oge ahụ bụ Michelle Obama, onye nwetara Nobel Laureate bụ Malala Yusufzai, na ọtụtụ ndị ọzọ ama ama.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Afọ iri ka e mesịrị, a napụtala ọtụtụ ụmụ agbọghọ ahụ ma ọ bụ mee ka ha sị na ogige ndị Boko Hara gbapụ. Agbanyeghị, mmadụ 87 n'ime mmadụ 276 ahụ ka nọ n'aka ndị Boko Haram. Dorcas bụ otu n'ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-efu efu bụ ndị dị nanị afọ 16 n'oge a tọọrọ ya.
Nne Esther, ejighị n'aka na ọ maghị ihe ga-eme ya, ọ fọrọ nke nta ka ọ ghara ikwe ya ịbị ndụ ya ga n'ihu. "Achọrọ m ka gọọmentị hapụ ụmụ anyị nwanyị, mee ka ha nweere onwe ha, ka ha laghachi n'ụlọ. Anyị chọrọ ịhụ ndị dị ndụ ka anyị nwee ike inwe obi ụtọ. Ndị na-adịghị ndụ, mee ka anyị mara ka anyị nwee ike ịwepu uche ebe ha nọ.''
Esther enwetabeghị ozi ọ bụla n’ebe e nwere ike ijide nwa ya nwanyị, mana ọ pụtara na vidio ndị Boko haram nweputara n’afọ 2016. Na vidio ahụ, Dọkas kwuru na ya bụ Maida, bụ́ aha ọhụrụ ndị jị ya kpọrọ ya.
"Ọ bụrụ na Dorcas ga-anụ onu m ugbu a, m ga-agwa ya na m dị ndụ, na obodo Chibok ka dị, ka o wee nwee ọchịchọ ahụ ịlaghachi n'ụlọ ịhụ anyị."
Mgbe anyị rụrụ Chibok
Ịkọ akụkọ si n'akụkụ a dịpụrụ adịpụ na ugwu ọwụwa anyanwụ Nigeria bụ njem dị ogologo na nke siri ike n'onwe ya. Ụzọ gara Chibok na-amalite site na Adamawa steeti bụ agbata agbata obi. Ọ bụ ogologo njem na esite ala kpọrọ nkụ na nke mepere emepe.
Anyị na-akwọ ụgbọala gafere mast telecom dara ada. Onye ndu anyị na-agwa anyị na a na-enyo enyo na Boko Haram kwaturu ya iji mebie nzikọrịta ozi. Olee otú ndị bi ebe a ga-esi na-akpọ maka enyemaka?
Otu ahụ ka na-akpa mkpamkpa na mpaghara ahụ.
Anyị na-agafe ma ọ dịkarịa ala ọkara iri na abụọ n'ọdụ ụgbọ mmiri ndị agha tupu anyị eruo ebe anyị na-aga.
Chibok n'onwe ya bụ obodo ndị agha nwere nnukwu ndị agha. Ndị agha ahụ eguzobela ụzọ nyocha abụọ na mgbochi nakwa mgbochi siri ike nke chi ọbụbọ ruo ututu.

Ebe foto si, Gift Ufuoma
Ụlọakwụkwọ ọhụrụ

Ebe foto si, Gift Ufuoma
Ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke gọọmentị dị na Chibok nwere ọdịdị ọhụrụ. Ewughachiri ya na afọ 2021, ma na enwere obere ihe a ga ejị cheta ihe mere ebe a n'abalị ahụ.
A kwatulu ụlọ obibi ebe a tọọrọ ụmụ agbọghọ ahụ. Enweghị ihe ịrịba ama ịjị cheta ihe mere ebe a afọ iri gara aga -- ma e wezụga ụfọdụ ihe mgbochi nke ụlọ ala dị ebe ahụ bụ ụlọ ochie.
Ọ bụ ezie na ọ dị ọhụrụ, eserese na ụlọ dị na ụlọ akwụkwọ ahụ na-acha ude-ụde. ịhe etere ya ejịrị chọo ya mma na na-apụ apụ, ikekwe n'ihi ihu igwe na-ekpo ọkụ, bụ nke mere ka ahịhịa dị n'ihu ụlọ ahụ tugharịa na-acha odo odo.
A họpụtara Muhammad Chiroma dịka onyeisi ụlọ akwụkwọ ọhụrụ mgbe ụlọ akwụkwọ ahụ meghere n'afọ 2021. O kwuru na enwela ọganihu na nchekwa kemgbe ọ malitere n'ọkwa ọchịchị.
Ọ fọrọ nke nta ka gburugburu anyị nịịle bụrụ a be ndị agha Naịjirịa na echekwa. Ka ịbịara ebe a, ọ ga adị gị ka ị nọ na be gị.
"Ndị nne na nna dugara umu ha na ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ na akpọghachịta ha azụ. Anyị na enweta umu akwụkwọ ọhụrụ enwetara ka ha bịa soro anyị gụọ akwụkwọ".
Naanị otu ụlọ akwụkwọ sekọndịrị na otu ụlọ akwụwkọ prịmarị dị na Chibok.
Chiroma kwuru na ya kwenyere na Chibok nwere nchekwa zuru oke ma nwee ntukwasi obi na ndịagha NAịjirịa na echekwa ha. Mana ịhe dị ka Febuwarị na Decemba 2023 na Febuwari 2024 ka ndị Boko haram nwokporo Chibok ma gbuo ịhe ruru mmadu ịrị na anọ ma zụrụ nrị na ịhe ndị ọzọ.
Ihe ịma aka na-aga n'ihu

Ebe foto si, Gift Ufuoma
A muru Manasseh Allen ma zulite ya na Chibok mana ọ hapuru Chibok gaa Abuja ịhe dị ka onwa asatọ ka ndị Boko Haram tọchaala umu akwụkwọ umunwanyị ahụ. Taa ọ na eme mgbasa ozị maka ndị obodo ha ma na alaghachị na obodo ha maka nne na nna ya.
"O nwere ọtụtụ ịhe na agbanwebeghị na Chibok, ma na ụlọ akwụkwọ. Nke bụ ezịokwu bu na aruru ụlọ n'ịme ụlọ akwụkwọ mana enweghị ebe a na amụ nkanuzu, ịhe nyocha lab, ọgba akwụkwọ, mmịrị na ịhe ndị ọzọ .
"ndị gọomentị anọghị ebe a.Enweghị ọkụ latrịk kengbe afọ ịrị garaaga. Ndị na azụ ahịa na ejị ọkụ latrịk azụ ahịa ama mme ọhụma".
"Tupuu 2014, a na m akọ ugbo, azu ọkụkọ, nakwa azụ. E sọ m na ndị kacha enye ndị mmadu ọrụ na Chibok"
O kwuru na emebiri ugbo ya na oge ndị boko haram na akpa mkpamkpa
"Ịhe niile m nwere ka ha gbara ọkụ. Ha gburu ndị na akpọrọ anyị ụgbọala, gbaa ọtụtụ ụgbọala anyị ọkụ. Ndị Boko haram mebịrị ịhe niile anyị nwere".
Manasseh kwenyere na enweghị ịhe gbanwere kengbe ọpụrụ na Chibok.
Manasseh kwuru na "Echere m na gọọmentị na ụwa nịile gbaghapuru ma chefuo Chibok".
Ebe kacha nweta ịhe mgbu na aka Boko Haram bụ na etịtị Chibok. Hassan Usman nabatara m na ahịa dị na etịtị Chibok. Hassan Usman na ere ịhe ejị arụ ụlọ ma chọọ ịgwa m okwu gbasara azu m ahịa na Chibok.
"ọnọdụ nchekwa na Chibok metutara azumahia anyị nke ukwuu, ọkachasị m. Ịhe m na ere bụ ahia ịhe ejị arụ ụlọ. O nweghịzị onye chọrọ ịrụ ụlọ ma ọ bụ dọzịe nke akụrịrị akụrị ọzọ".
O kwuru na "otutu ahapura Chibok gbapu kengbe afọ 2014, ọkachasi mgbe atọorọ umu akwụkwọ. Mana nchekwa na adị mma obere-obere"
Kengbe atọorọ umuakwukwo nwanyị Chibok na 2014, ihe kariri umuakwukwo 1400 ka atọọrọ. Opekatampe awakporo ulo akwụkwọ ụgboro 10. Na onwa Maach afọ a na ugbo abụọ awakporo umu akwukwo, atọorọ ịhe rụrụ 3000.
Mgbalị na-aga n'ihu
Na isi obodo Abuja, a na m ezute Senator Muhammad Ali Ndume bụ onye omebe iwu obodo si Borno South Senatorial District, ebe Chibok dị, maka pati APC na-achị achị.
"Gọomentị nwere ịhe ha na eme, ha na egọsị mmasị" ka ọ gwara m. "a ga m agwa ndị nne na nna ahụ ka ha jịsị ịke nwee ndịndị ma na ekepe ekpere na umu ha ga alọta
O kwuru na ego gọomentị nyere ndị ntọọrị ahụ na ọchịchị garaaga nke mere ejirị zọpụta ụmụaka rụrụ 100 mere ka ịhe nịile taa akpụ.
"Naanị Chukwu maara ego ole ha kwuru. Ọ dị ka ndị ntọ amatara na ha tọrọ mmadu ha enweta ego"
"Nke ahụ bụ mmejọ meghere ohere maka ọnọdụ nchekwa a ugbu a."
Gọọmenti n'oge ahụ agọnarị akụkọ na-ekwu na ọ kwụrụ ụgwọ mgbapụta maka ntọhapụ ụmụ agbọghọ Chibok 21 n'afọ 2016. Mana n'afọ na-esote, ndị ọrụ kwetara na ha nwetara ntọhapụ ụmụ agbọghọ Chibok 82 ndị ọzọ nwere tughapu ndị Boko Haram ejidere na ngbawe ndị nga.
Ndume jụrụ ịkatọ na ya dara ịlọchịtanya ndị Chibok na gọọmentị ma kpọọ oku ka gọọmentị mee ihe iji napụta ụmụ agbọghọ fọdụrụ na ndị ọzọ nọ na njide Boko Haram.

Ebe foto si, Gift Ufuoma
Ọ sịrị, "Ndị Sineti ga-amaliteghachi n'abalị iri na isii n'ọnwa Eprel nke ga-abụ ụbọchị abụọ ka e mechara ncheta afọ iri nke tọọrọ ụmụ agbọghọ Chibok."
"Ana m ekwe nkwa iwepụta akwụkwọ ịkpọku gọọmentị ka ha tinyekwuo mgbalị iji gbochie ntọọrọ mmadụ na ime ka ụlọ akwụkwọ dị mma," ka Senator Ndume na-agwa m.
Olileanya ndị nne na nna ụmụ akwụkwọ Chibok 87 na-efunarị na ha ga-eweghachi ụmụ ha nwanyị nwere ike na-agwụ, mana maka Esther, ọ naghị ada mbà.
'Amaara m na Chineke nọnyeere ya n'ebe ahụ, enwere m olileanya na otu ụbọchị m ga-ahụ ya ọzọ.''










